Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Efesọs 6:4 - Bible Nso

4 Ndi bu nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùputa ha n'ọzùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Efesọs 6:4
32 Iomraidhean Croise  

N'ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe; ka Jehova we weta n'isi Abraham ihe O kwuru bayere ya.


Devid we si Solomon nwa-ya, Di ike, nwe kwa ume, me ya: atula egwu, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova Chineke, bú Chinekem, nọyere gi; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi, rue mb͕e i jezuru ozi nile nke òfùfè ulo Jehova.


nye kwa Solomon nwam obi zuru okè, idebe ihe nile I nyere n'iwu, na ihe-àmà-Gi nile, na ukpuru-Gi nile, na ime ihe ndia nile, na iwu ulo uku ahu, nkem'doziworo ihe bayere ya.


Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di; Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua.


Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata; Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ.


Zulite nwata dika uzọ-ya si di, Ọbuná mb͕e o mere okenye ọ gaghi-esi nime ya wezuga onwe-ya.


Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe: Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.


Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike; E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ.


Onye di ndu, onye di ndu, onye ahu gēkele Gi, dika m'si eme ta: Nna gēme ka umu mara ezi-okwu-Gi.


ka ihe we nāgara gi nke-ọma, ka i we di kwa ogologo ndu n'elu uwa.


Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa nkpuru-obi-gi nke-ọma, ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n'obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi; kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha;


i gējisi kwa ike izí ha-umu-gi, i gēkwu kwa okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n'ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n'uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ.


Ndi bu nna, akpasula umu-unu iwe, ka obi ghara ifù ha.


ebe emerem ka m'cheta okwukwe iru-abua nādighi ya nke di nime gi; bú okwukwe nke buru uzọ biri nime nne-gi ochie Lois na nne-gi Yunaisi; ma emerem ka m'kweye na o bi kwa nime gi.


ebe i ma-kwa-ra na i sitere n'oge i di na nwa ọhu mata ihe di nsọ nile edeworo n'akwukwọ nsọ nke puru ime ka i buru onye-amam-ihe inata nzọputa site n'okwukwe nke i kwere na Kraist Jisus.


Ma ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n'ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè.


Manoa we si, Ub͕u a ka okwu-gi nile rè: gini gābu ikpé bayere nwata ahu, gini gābu kwa omume-ya?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan