Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Efesọs 6:12 - Bible Nso

12 N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Efesọs 6:12
25 Iomraidhean Croise  

Jehova we si Setan, Òle ebe i si bia? Setan we za Jehova, si, Site n'igaghari n'uwa, na site n'ijeghari nime ya.


Jisus we za, si ya, Ngọzi nādiri gi, Saimon Bā-Jona: n'ihi na anu-aru na ọbara ekpugheghi ya nye gi, kama ọ bu Nnam Nke bi n'elu-igwe.


ma ncheb͕u nile nke oge a, na aghughọ nke àkù, na nbata nke agu ihe di iche iche ọzọ, nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru.


Jisienu ike isi n'ọnu-uzọ di warara ba: n'ihi na ọtutu madu, ka M'si unu, gāchọ ibà nime ya, ma ha agaghi-enwe ike.


Mb͕e Mu na unu nọ kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke, unu esetighi aka-unu imegidem: ma nka bu oge hour unu, na ike nke ọchichiri.


Ub͕u a ka ikpé uwa nka di: ub͕u a ka agāchupu onye-isi uwa nka.


Ọ dighi ọtutu okwu Mu na unu gēkwu ọzọ site n'ub͕u a, n'ihi na onye-isi nke uwa nka nābia: ọ dighi kwa ihe ọ bula o nwere nimem;


ikpé, n'ihi na ekpewo onye-isi uwa nka ikpé.


isaghe anya-ha, ka ha we si n'ọchichiri chigharia ba n'ìhè, si kwa n'ike Setan chigharikute Chineke, ka ha we nara nb͕aghara nmehie nile na ihe-nketa n'etiti ndi edoworo nsọ site n'ikwere na Mu.


N'ihi na emewo ka m'kweye, na ọnwu, ma-ọbu ndu, ma-ọbu ndi-mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi di iche iche, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche,


Ma nka ka m'nēkwu, umu-nnam, na anu-aru na ọbara apughi iketa ala-eze Chineke; ihe nēre uré eketaghi kwa ereghi-uré.


Ọ bughi kwa ihe iju anya; n'ihi na Setan onwe-ya nēme onwe-ya ka o yie mọ-ozi nke ìhè.


ndi chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndi nēkweghi ekwe kpu ìsì n'etiti ha, ka inye-ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraist, Onye bu onyinyo Chineke, we ghara iwakwasi ha.


mb͕e ọ di Ya ezi nma ikpughe Ọkpara-Ya nimem, ka m'we zisa ozi ọma Ya n'etiti ndi mba ọzọ; ngwa ngwa mu na anu-aru na ọbara ab͕aghi ìzù:


kachasi ha nile elu, bú ibu-onye-isi, na ichi-isi, na ike, na ibu-onye-nwe-madu, na aha ọ bula anākpọ ya aha, ọ bughi nání n'oge a, kama ọ bu kwa n'oge nke gaje ibia:


Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye were ngọzi nile ọ bula nke Mọ Nsọ gọzie ayi n'ebe di n'elu-igwe nime Kraist:


nke unu jeghariri nime ha n'oge gara aga n'uzọ oge nke uwa nka, dika onye-isi nke ike nke mbara-elu-igwe si chọ, bú mọ ahu nke nālusi ọlu ike nime umu nke ekweyeghi-ekwenye ub͕u a;


ka ewe me ub͕u a ka ibu-isi nile na ike nile nke di n'ebe di n'elu-igwe mara ọtutu okpukpu amam-ihe Chineke di iche iche site n'aka nzukọ-Ya,


Onye dọputara ayi n'ike nke ọchichiri, we webiga ayi n'ala-eze nke Ọkpara nke ihu-n'anya-Ya;


mb͕e O yipuchasiri n'aru ibu-ndi-isi nile na ichi-isi nile ihe-agha-ha nye Onwe-ya, O were nkwuwa-okwu gosi ha n'iru ọra, nēdughari ha n'ọṅù-agha n'elu obe-Ya.


Ma ọ buru kwa na onye ọ bula nāb͕a nb͕a, ekpughi ya okpu-nmeri, ma ọ buru na ọ b͕aghi nb͕a otú ọ di n'iwu.


Ya mere ka ayi onwe-ayi, ebe ayi nwere oké ìgwè ndi-àmà di otú a ndi b͕ara ayi gburugburu dika igwe-oji, ka ayi tupu kwa ibu nile ọ bula, ya na nmehie ahu nke nārapara ayi n'aru nke-uku, ka ayi were kwa ntachi-obi b͕a ọsọ ahu edebere ayi n'iru,


Unu akēguzogideghi rue ọbara, n'ib͕a nb͕a megide nmehie:


Onye nọ n'aka-nri nke Chineke, ebe Ọ gara ba n'elu-igwe; edowo kwa ndi-mọ-ozi na ndi nāchi isi na ndi di ike n'okpuru Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan