Ọ̀ bu dika nka ka obubu-ọnu nke M'nārọputa bu? bú ubọchi madu gēweda nkpuru-obi-ya n'ala? Ọ̀ bu iruda isi-ya n'ala dika amì, na ib͕asa-ákwà-nkpe na ntu n'okpuru ya? ọ̀ bu nka ka i gākpọ obubu-ọnu na ubọchi nātọ Jehova utọ?
N'ìhi gini kwa ka frankincense ji biakutem site na Sheba, calamus ọma kwa site n'ala di anya? àjà-nsure-ọku-unu, ha abughi ihe natọ utọ, àjà-unu kwa, ha atọghm utọ.
Ma enwezuwom ihe nile, anamababiga kwa ókè: emewo ka m'zue ezù, ebe m'natara n'aka Epafrọdaitọs ihe nile si n'aka-unu bia, isisì nke ihe ísì utọ, àjà nke anānara nke-ọma, nke nātọ Chineke ezi utọ.
Ma ọ buru na nwanyi ọ bula di-ya nwuru nwere umu ma-ọbu umu umu, ka ha buru uzọ muta isọpuru Chineke n'aru ndi èzí-na-ulo nke aka ha, na inyeghachi ndi muru ha ihe: n'ihi na nka bu ihe anānara nke-ọma n'iru Chineke.
N'ihi nka, ebe ayi nānata ala-eze nke anāpughi ime ka o me nkpatu, ka ayi nwe amara, ka ayi we site na ya were egwu Chineke na ujọ kpe ekpere n'uzọ nke gātọ Chineke utọ:
ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si cho, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist.
Devid we kekwasi mma-agha-ya n'uwe-nwuda-ya, we jisie ike ije; n'ihi na ọ nwaghi ya. Devid we si Sọl, Apughm iwere ihe ndia je; n'ihi na anwaghm ha. Devid we yipu ha n'aru ya.