Efraim, ọ̀ bu nwa-nwoke di oké ọnu-ahia M'nwere? ọ̀ bu nwa nātọm utọ nke-uku? n'ihi na ka mb͕e ra M'nēkwu okwu megide ya, anamecheta ya nke-ọma rue ub͕u a: n'ihi nka ngiri-afọm adaworo ya udà; aghaghm inwe obi-ebere n'aru ya ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Ma ọnu-ọgugu umu Israel gādi ka ájá oké osimiri, nke anāgagh ātùta, nke anāgaghi-agu kwa ọnu; ọ gēru kwa na, n'ebe ahu nke anāsi ha, Ọ bughi ndim ka unu bu, n'ebe ahu ka agāsi ha, Umu Chineke di ndu ka unu bu.
ka unu we buru umu nke Nna-unu Nke bi n'elu-igwe: n'ihi na Ọ nēme ka anyanwu-Ya nāwakwasi ajọ madu na ezi madu, Ọ nēme kwa ka miri zokwasi ndi ezi omume na ndi ajọ omume.
ka unu we ghọ ndi nādighi ita uta ndi nāghọghi kwa aghughọ, umu Chineke ndi anāpughi ita uta n'etiti ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke nēnwe kwa anya-uhie, ndi anāhu unu n'etiti ha dika ndi nēnye ìhè n'uwa,