asi na ọ bu ezie na Chineke bu otù, Onye gāgu ndi obibì-úgwù na ndi ezi omume site n'okwukwe, were kwa okwukwe ahu gua ndi ebìghi-úgwù na ndi ezi omume.
nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, bú ndi edoworo nsọ nime Kraist Jisus, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ, ha na ndi nile nākpọku aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n'ebe nile, bú Onye-nwe ayi na ha:
N'ihi na nime otù Mọ Nsọ ka emere ayi onwe-ayi nile baptism ibà n'otù aru, ma ayi bu ndi-Ju ma-ọbu ndi-Grik, ma ayi bu ndi-orù ma-ọbu ndi nwere onwe-ha; eme-kwa-ra ka ayi nile ṅua nime otù Mọ Nsọ.
ma n'ebe ayi nọ otù Chineke di, bú Nna, Onye ihe nile sitere na Ya, Onye ayi onwe-ayi di-kwa-ra Ya; otù Onye-nwe-ayi di kwa, bú Jisus Kraist, Onye ihe nile sitere n'aka-Ya, ayi onwe-ayi site-kwa-ra n'aka-Ya.
N'ihi na asi na onye ahu nke nābia nēkwusa Jisus ọzọ, onye ayi nēkwusaghi, ma-ọbu asi na unu nānara mọ di iche, nke unu nānaraghi, ma-ọbu ozi ọma di iche, nke unu nānaraghi nke-ọma, unu nānagide ya nke-ọma.
N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.
E, tukwasi kwa, anamagu kwa ihe nile n'ihe-iyì n'ihi ọkika nke ọmuma Kraist Jisus, bú Onye-nwem: Onye m'yiri iyì ihe nile nkem n'ihi Ya, anamagu kwa ha n'ihe-nkpofu, ka m'we rita Kraist n'urù,
Pọl, orù nke Chineke, na onye-ozi nke Jisus Kraist, dika okwukwe ndi Chineke rọputara si di, ya na nmazu nke ezi-okwu ahu nke di n'uzọ nsọpuru-Chineke,
Pọl nka nēdegara Taitọs akwukwọ, bú ezi nwa nkem dika okwukwe ayi kwekọrọ si di: Amara na udo diri gi nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nzọputa-ayi puta.
ha we dahie, ọ bu ihe anāpughi ime bu ime ka ha buru ndi ọhu ọzọ ichèghari echèghari; ebe ha nākpọgidere onwe-ha Ọkpara Chineke n'obe ọzọ, debe kwa Ya n'ọnọdu-ihere n'iru ọra madu.
Ma otù onye gāsi, Gi onwe-gi nwere okwukwe, mu onwem nwe-kwa-ra ọlu: gosim okwukwe-gi ma ọlu-gi adighi ya, mu onwem gēsite kwa n'ọlum gosi gi okwukwem.
bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n'uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, site na nbilite-n'ọnwu nke Jisus Kraist;
Saimon Pita, orù na onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi ketaworo okwukwe di oké ọnu-ahia ra ka nke ayi ketaworo n'ezi omume Onye ahu, bú Chineke-ayi na Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist;
Ndi m'huru n'anya, ebe m'nānu ọku nile n'obi idegara unu akwukwọ bayere nzọputa ahu azọputakọrọ ayi, ọ dim nkpà idegara unu akwukwọ nāriọ unu ka unu nāb͕asi nb͕a ike n'ihi okwukwe ahu nke enyere ndi nsọ n'aka nání otù mb͕e idebe.