Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Efesọs 4:28 - Bible Nso

28 Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n'ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụọ ezi ọrụ, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Efesọs 4:28
33 Iomraidhean Croise  

Ihe m'nāhughi, Gi onwe-gi zím ya: Ọ buru na emewom ajọ omume, m'gaghi-eme kwa ya ọzọ?


Gi enwela anya-uku n'ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwoke nọ, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwayi nọ, ma-ọbu n'ebe ehi-ya di, ma-ọbu n'ebe inyinya-ibu-ya di, ma-ọbu n'ebe ihe ọ bula di nke madu-ibe-gi nwere.


Onye nēzu madu n'ori re ya, ma-ọbu na asi na ahu ya n'aka-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.


Àkù nke sitere n'ihe-efu gēbilata: Ma onye ji aka-ya achikọta ihe gāba uba.


Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya: Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ.


Ogologo ubọchi nile ka ọ chọsiworo ihe ike nke-uku: Ma onye ezi omume nēnye, ọ dighi-eb͕ochi kwa aka-ya inye ihe.


Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya: Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.


Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova? Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori, We were aha Chinekem me ihe ọjọ.


Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n'ala; E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru.


Ùnu ganēzu ori, nēb͕u madu, nākwa iko, nāṅu iyi ugha, nēsurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nējeso chi ọzọ di iche iche nke unu nāmaghi,


Ọ bu nání ọb͕ub͕a-iyi, na okwu-ugha, na ob͕ub͕u-madu, na izu-ori, na ikwa-iko; ha etipúwo etipú, iwusi-ọbara-madu emetuwo kwa iwusi-ọbara-madu.


O we sim, Nka bu ọb͕ub͕a-iyi nke nāpùru iru ala nka nile: n'ihi na onye ọ bula nke nēzu ori ka agēkpochapu n'ebe a dika o si di; ọ bu kwa onye ọ bula nke nāṅu iyi ka agēkpochapu n'ebe a dika o si di.


Zakiọs we guzọ, si Onye-nwe-ayi, Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m'nwere ka m'gēnye ndi-ob͕eye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n'ebubo ugha, m'gēnyeghachi anọ anọ.


Ya mere mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu, unu amalite-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.


Ma nka ka o kwuru, ọ bughi n'ihi na ọ kpọrọ ndi-ob͕eye ihe; kama n'ihi na ọ bu onye-ori, na ebe o ji àkpà-ego, ọ nēwepu ihe anētiye nime ya.


N'ihi na ufọdu nēchè, ebe Judas ji àkpà-ego, na Jisus siri ya, Zuta ihe di ayi nkpà n'ememe; ma-ọbu, ka o nye ndi-ob͕eye ihe.


n'akuku ihe nākpà ndi nsọ, nēnwekọnu ihe; nāb͕asonu ọlu ile ndi-ọbìa anya nke-ọma.


ayi nādọb͕u kwa onwe-ayi n'ọlu, were aka-ayi nālu ọlu: mb͕e anēkwutọ ayi, ayi nāgọzi: mb͕e anēsob͕u ayi, ayi nānagide:


N'ihi na asi na obi di ọku di ya, ọ bu ihe agānara nke-ọma dika ihe ọ bula madu nwere si di, ọ bughi dika ihe ọ nēnweghi.


na nime ọtutu nnwaputa nke nkpab͕u, nbabiga-ókè nke ọṅù-ha na ob͕eye-ọnu-ntu ha bu babigara ókè rue àkù nke afọ-ofufo-ha.


Ya mere otú a, otú ayi nwere oge, ka ayi nālu ezi ihe n'ebe madu nile nọ, ma ka ayi nālu ezi ihe karisia n'ebe ndi èzí-na-ulo nke okwukwe-ayi nọ.


ka ha nēme ezi ihe, ka ha buru ọgaranya n'ọlu ọma nile, ka ha buru ndi kwadebeworo ime ka ndi ọzọ keta ihe ha nwere, ka ha buru ndi kwere ka ndi ọzọ so ha nwekọ ihe;


Ka ndi-ayi muta kwa ibu ndi-isi n'ọlu ọma ib͕o nkpà nākpa umu-nna-ayi, ka ha ghara ibu ndi nāmighi nkpuru.


Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, anamezube kwa ka i kwusie okwu bayere ihe ndia ike, ka ndi kweworo okwu Chineke we tukwasi uche n'ibu ndi-isi n'ọlu ọma. Ihe ndia di nma buru kwa ihe bara madu urù:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan