27 enye-kwa-la ekwensu uzọ.
27 Enyela ekwensu ohere.
Ma Pita siri, Ananaias, n'ìhi gini ka Setan mejuru obi-gi igwa Mọ Nsọ okwu-ugha, na idebere onwe-gi ufọdu nime ọnu-aha nke iberibe ala gi?
Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru.
Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa.
tukwasi ihe nile ndia welienu ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu nime ya.
Ya mere donu onwe-unu n'okpuru Chineke; ma guzogidenu ekwesu, ọ gāb͕apu kwa n'ebe unu nọ.
Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi: