Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Efesọs 4:26 - Bible Nso

26 Unu emehiela mb͕e unu nēwe iwe: ekwela anyanwu da na nkpasu-iwe-unu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Efesọs 4:26
22 Iomraidhean Croise  

Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma: Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ.


Manu jijiji, emehie-kwa-la: Sinu otú a n'obi-unu n'elu ihe-ndina-unu, we dere du. Selah


Ndi-orù-gi ndia nile gārida-kutem, kpọ isi ala nyem, si, Pua, gi onwe-gi, na ndi nile nke nọ n'ukwu-gi: emesia m'gāpu. Ọ we si n'ebe Fero nọ pua n'iwe di ọku.


Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta: Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ.


Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ; Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie.


Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo: Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa.


Ekwela ka akpasue gi iwe ọsọsọ nime mọ-gi: n'ihi na nkpasu-iwe nwere ọnọdu-ya n'obi ndi-nzuzu.


Agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ' n'ihi na ọ gaghi-abà n'ala ahu nke M'nyeworo umu Israel, n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum na miri Meriba.


ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.


Ma mb͕e Jisus huru ya, iwe were Ya nke-uku, Ọ si ha, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem; unu eb͕ochila ha: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a.


Mb͕e O lesiri ha anya gburugburu n'iwe, ebe ọ nēwuta Ya nke-uku, bú na anēme ka obi-ha ma etili, O we si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di mbu.


N'ubọchi-ya ka i gēnye ya ugwọ-ọlu-ya, anyanwu agaghi-adakpu kwa ya; n'ihi na onye ewedara n'ala ka ọ bu, nke ahu ka ya onwe-ya nātukwasi kwa nkpuru-obi-ya: ka o we ghara ikpọku Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi.


Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe:


n'ihi na iwe madu adighi-alu ọlu ezi omume Chineke.


Jonatan we si na table bilie n'iwe di ọku, o righi kwa nri n'ubọchi nke-abua nke ọnwa ahu: n'ihi na o wutara ya n'ihi Devid, n'ihi na nna-ya mere ya ihe-ihere.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan