Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Efesọs 4:18 - Bible Nso

18 n'ihi na emewo ka ha b͕a ọchichiri n'èchìchè-uche-ha, eme kwa ka ha buru ndi ala ọzọ n'ebe ndu nke Chineke di n'ihi amaghi-ihe di nime ha, n'ihi na anēme ka obi-ha me etili;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ndị ọchịchịrị gbachiri nghọta ha. Ndị dị otu a enweghị oke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nʼihi na obi ha mechiri emechi, ha adịghị aghọtakwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Efesọs 4:18
34 Iomraidhean Croise  

Legide ọb͕ub͕a-ndu-Gi: N'ihi na ebe nile nke b͕ara ọchichiri nke uwa juputara n'ebe-obibi nile nke ihe-ike.


Ọzọ, n'ugwu a ka Ọ gēloda iru ihe-nfuchi ahu eji afuchi ndi nile di iche iche, na ihe-nkpuchi ahu eji ekpuchi mba nile.


ka M'we jide ulo Israel n'obi-ha, n'ihi na ha esiwo n'ebe M'nọ ghọ ndi ala ọzọ site n'arusi nile ha.


Ma mb͕e obi-ya di elu, mb͕e mọ-ya di kwa ike ime ihe-nganga, emere ka o si n'oche-eze nke ala-eze-ya ridata, ọ bu kwa ebube-ya ka ewezugara n'ebe ọ nọ:


na enyi-nnunu, na eb͕e-abali, na nnunu oké osimiri, na eb͕e di iche iche;


N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.


Mb͕e O lesiri ha anya gburugburu n'iwe, ebe ọ nēwuta Ya nke-uku, bú na anēme ka obi-ha ma etili, O we si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di mbu.


O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.


Ya mere Chineke lefuru oge nile nke amaghi-ihe anya; ma ub͕u a Ọ nāgwa madu ka ha nile chègharia n'ebe nile:


Ma ub͕u a, umu-nnam, amataram na unu mere ya n'amaghi-ihe, dika ndi-isi-unu me-kwa-ra.


Dika ha juru inọgide n'imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n'aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi;


N'ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n'anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata;


Gini kwa? Ihe Israel nāchọ, nke ahu ka ọ nāhughi; ma nrọputa ahu huru ya, ma emere ka obi ndi fọduru me etili:


ọ buru kwa na eme ka i kweye na gi onwe-gi bu onye-ndú nke ndi-ìsì, ìhè nke ndi nọ n'ọchichiri,


N'ihi na ebe uwa n'amam-ihe nke Chineke nējighi amam-ihe-ya mara Chineke, ọ di Chineke ezi nma iji ihe-nzuzu nke ihe ahu anēkwusa izọputa ndi kwere.


nke ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-isi oge a mara: n'ihi na asi na ha mara ya-ri, ha agaghi-akpọgidewori Onye-nwe ebube n'obe:


ma emere ka uche-ha ma etili: n'ihi na rue ubọchi ta n'ọgugu ọb͕ub͕a-ndu ochie otù ihe-nkpudo ahu nādigide, ebe anēkpugheghi na anēme ya ka ọ ghara idi irè nime Kraist.


ndi chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndi nēkweghi ekwe kpu ìsì n'etiti ha, ka inye-ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraist, Onye bu onyinyo Chineke, we ghara iwakwasi ha.


Otú ọ di, mb͕e ahu, ebe unu nāmataghi Chineke, unu bu orù nke ndi nābughi chi dika ha si puta n'uwa:


Unu onwe-unu ka O me-kwa-ra ka unu di ndu, mb͕e, unu nọ n'ọnwu site na ndahie nile unu na nmehie nile unu,


na unu guzoro iche n'ebe Kraist nọ n'oge ahu, ndi emereri ka unu buru ndi ala ọzọ n'ebe ọnọdu ndi amuru ndi Israel di, unu bu kwa ndi-ọbìa n'ebe ọb͕ub͕a-ndu nile nke nkwa ahu di, ndi nēnweghi olile-anya, ndi nāmaghi kwa Chineke n'uwa.


Unu onwe-unu kwa, ọ bu ezie na emereri unu ka unu buru ndi ala ọzọ n'oge gara aga, buru kwa ndi-iro n'èchìchè-uche-unu nime ajọ ọlu nile unu, ma ub͕u a ka O mere ka unu na Ya di n'otù


ọ bughi n'ọchichọ ọjọ nke agu ihe ọjọ, ọbuná dika ndi mba ọzọ ndi nāmataghi Chineke;


ọ bu kwa onye puru iwere nwayọ nēmeso ndi nāmaghi ihe ndi nējehie kwa ejehie, n'ihi na adighi-ike di kwa ya onwe-ya gburugburu;


ma nání onye-isi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū nke-abua, nání otù mb͕e n'arọ, nāb͕aghi aka ọbara, nke ọ nēche n'iru Chineke n'ihi onwe-ya, na n'ihi amaghi-ama nile nke ndi Israel:


Unu ndi nākwa iko, ùnu amataghi na ibu eyì nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu eyì nke uwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke.


dika umu nke iṅa-nti, unu eme-kwa-la onwe-unu ka unu di ka agu ihe ọjọ ahu si di, bú nke guru unu na mbu n'amaghi-ihe-unu:


Ma onye nākpọ nwa-nna-ya asì nọ n'ọchichiri ahu, nējeghari kwa nime ọchichiri ahu, ọ mataghi kwa ebe ọ nāga, n'ihi na ọchichiri ahu mere ka anya-ya kpue ìsì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan