Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Efesọs 4:11 - Bible Nso

11 Ya onwe-ya nye-kwa-ra ufọdu ka ha buru ndi-ozi; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi-amuma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nēzisa ozi ọma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nāzù aturu Chineke na ndi-ozizí;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 O nyekwara ụfọdụ onyinye ị bụ ndị ozi, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Efesọs 4:11
19 Iomraidhean Croise  

Ma ọtutu ubọchi ka Israel nọ nēnweghi Chineke nke ezi-okwu, nēnweghi kwa onye-nchu-àjà nēzí ihe, nēnweghi kwa iwu:


M'gēnye kwa unu ndi-ọzùzù-aturu dika obim si di, ndi gēji ihe-ọmuma na inwe-uche azù unu.


nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.


Ma ndi-amuma na ndi-ozizí di n'Antiọk, nime nzukọ Kraist di n'ebe ahu, bú Banabas, na Simeon onye anākpọ Naiga, na Lusiọs onye Sairini, na Manaen onye azùkọrọ ya na Herod, bú tetrarch, na Sọl.


Nēzenu onwe-unu na ìgwè aturu ntà nile, nke Mọ Nsọ mere unu ndi nēlekota ya anya n'etiti ya, ka unu nāzù nzukọ Chineke dika aturu, nke O ji ọbara nke Ya onwe-ya zutara Onwe-ya.


Echi-ya ayi we pua, je rue Sisaria: ayi we ba n'ulo Filip onye nēzisa ozi ọma, nke bu otù nime ndikom asa ahu, ayi na ya we nọgide.


ma-ọbu ije-ozi, ka ayi nānọ n'ije-ozi-ayi; ma-ọbu onye nēzi ihe, ya nọ n'ozizi-ya;


Ma òkìkè nke onyinye-amara di, ma ọ bu otù Mọ Nsọ ahu.


ewu-kwa-ra unu dika ulo n'elu ntọ-ala nke bu ndi-ozi na ndi-amuma, nke isi nkume nime nkuku ntọ-ala ahu bu Kraist Jisus onwe-ya;


nke anēmeghi ka umu madu mara ya n'ọb͕ọ ọzọ, dika ekpughere ya ub͕u a nye ndi-ozi-Ya na ndi-amuma-Ya di nsọ nime Mọ Nsọ;


N'ihi nka Ọ si, Mb͕e Ọ rigoro n'elu, Ọ dọtara usu ndi adọtara n'agha n'agha, Nye kwa madu onyinye di iche iche.


Ma gi onwe-gi, nēnwe anya-udo n'ihe nile, huju anya, lua ọlu nke onye nēzisa ozi ọma, jezu ozi-gi.


N'ihi na mb͕e unu kwesiri ibu ndi-ozizí n'ihi oge, ọ di unu nkpà ọzọ ka madu zí unu ihe bu ihe-ozizí mbu nke nmalite okwu si n'ọnu Chineke puta; unu aghọwo kwa ndi miri-ara di nkpà, ọ bughi nri siri ike.


Ma unu onwe-unu, ndi m'huru n'anya, chetanu okwu nile nke ndi-ozi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist buru uzọ kwu;


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


Mb͕idi obodo ahu nwe-kwa-ra ntọ-ala iri na ab͕ua, n'elu ha ka edereri aha iri na abua nke ndi-ozi iri na abua ahu nke Nwa-aturu ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan