Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Efesọs 3:7 - Bible Nso

7 nke emerem ka m m'buru onye nēje ozi ya, dika onyinye nke amara ahu nke Chineke si di nke enyerem dika ilusi-ọlu-ike nke ike-Ya si di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 E mere m ka m bụrụ onyeozi nke oziọma a, dịka onyinye amara nke Chineke si dị, bụ nke e nyere m site nʼịrụ ọrụ nke ike ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Efesọs 3:7
22 Iomraidhean Croise  

Ọzọ, site n'ubọchi ta Mu onwem bu Ya; ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam: anamalu ọlu, ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu?


Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ga: n'ihi na onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n'iru mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel:


Onye ayi sitere n'aka-Ya nata amara na ọlu onye-ozi, rue iṅa-nti nke okwukwe n'etiti mba nile, n'ihi aha-Ya:


N'ihi na esiterem n'amara nke enyerem si onye ọ bula nọ n'etiti unu, ka ọ ghara itukwasi uche n'onwe-ya kari nke o kwesiri itukwasi uche; kama itukwasi uche n'inwe uche zuru okè, dika Chineke kère ọtùtù nke okwukwe nye madu nile n'otù n'otù.


ka m'we buru onye nēfè Kraist Jisus òfùfè ijekuru ndi mba ọzọ, nālu kwa ọlu onye-nchu-àjà nke ozi ọma Chineke, ka ewe me ka iche-ndi-mba-ọzọ-n'iru-Chineke buru ihe agānara nke-ọma, ebe edoro ya nsọ nime Mọ Nsọ.


Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.


Gini kwa bu Apọlos? gini bu kwa Pọl? Ndi nēje ozi, ndi unu si n'aka-ha kwere; dika Onye-nwe-ayi nye-kwa-ra ha abua n'otù n'otù.


Onye me-kwa-ra ayi ka ayi rue ibu ndi nēje ozi ọb͕ub͕a-ndu ọhu; ọ bughi nke ihe edeworo n'akwukwọ, kama ọ bu nke Mọ Nsọ: n'ihi na ihe ahu edeworo n'akwukwọ nēb͕u eb͕u, ma Mọ ahu nēnye ndu.


N'ihi nka, ebe ayi nwere ije-ozi a, dika emere ayi ebere, ike agwughi ayi n'obi:


(n'ihi na Onye lusiri Pita ọlu ike ka ọ we lua ọlu onye-ozi nke ndi obibì-úgwù, Onye ahu lusikwara m ọlu ike ka m'we jekuru ndi mba ọzọ);


mata kwa otú ike-Ya di uku ri nne n'ebe ayi nọ, bú ndi kwere, dika ilusi-ọ1u-ike nke idi-ike nke ike-Ya si di,


asi na ọ bu ezie na unu nuru okwu bayere ọchichi-èzí-na-ulo nke amara Chineke ahu nke enyerem n'ebe unu nọ;


Ma otuto diri Onye ahu Onye puru imebiga ókè nke-uku ri nne kari ihe nile nke ayi nāriọ ma-ọbu nke ayi nātughari uche, dika ike nke nālusi ike nime ayi si di,


Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya;


Onye aru nile, ebe anēwere nkwonkwo nile ọ bula nke nnyezu kwukọ ya nke-ọma jikọ kwa ya, dika ilusi-ọ1u-ike nke akuku nile ọ bula n'otù n'otù n'ọtùtù-ha si di, aru nile ahu nēsite na Ya nēme ka aru ba uba iwuli onwe-ya elu dika ulo nime ihu-n'anya.


anamadọb͕u kwa onwem n'ọlu ime ihe a, nāb͕asi nb͕a ike dika i1usi-ọ1u-ike nke Ya si di, nke nālusi ike nimem n'ike.


Ọ bu kwa n'ihi nka ka ayi onwe-ayi nēkele kwa Chineke nēwepughi aka, na, mb͕e unu natara okwu nke unu nuru n'ọnu-ayi, bú okwu nke Chineke, ọ bughi okwu madu ka unu nara nke-ọma, kama, otú ọ di n'ezi-okwu, ọ bu okwu Chineke, nke nālusi kwa ọlu ike nime unu ndi kwere ekwe.


Ya me ka unu zue okè n'ezi ihe nile ọ bula ime ihe Ọ nāchọ, nēme nime ayi ihe nātọ ezi utọ n'iru Ya, site n'aka Jisus Kraist; Onye otuto nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan