Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Efesọs 3:19 - Bible Nso

19 na imara ihu-n'anya Kraist nke kariri ọmuma nke-uku ri nne, ka ewe me ka unu zue ezù rue ozuzù nile nke Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 na ịmatakwa ịhụnanya nke Kraịst nke karịrị amamihe, ka unu jupụtakwa nʼizuoke niile nke Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Efesọs 3:19
24 Iomraidhean Croise  

Mu onwem, n'ezi omume ka m'gāhu iru-Gi: Ka afọ jum n'udi gi, mb͕e m'tetara.


M'gābiaru kwa ebe-ichu-àjà nke Chineke, Rue Chineke aru, bú ọṅù nke otite-egwú-ọṅùm: M'gēkele kwa Gi n'ubọ-akwara, Chineke, bú Chinekem.


Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n'ihi na ndi ahu ka afọ gēju.


N'ihi na site na njuputa-Ya ka ayi onwe-ayi nile natara, ọbuná amara nēsochi amara.


Ma nka bu ndu ebighi-ebi ahu, ka ha mara Gi, Nke nání Gi bu ezi Chineke, mara kwa Onye I zitere, bú Jisus Kraist.


Ònye gēkewapu ayi n'ihu-n'anya nke Kraist? Ọ̀ bu nkpab͕u, ma-ọbu oké nkpà, ma-ọbu nsob͕u, ma-ọbu oké unwu, ma-ọbu ib͕a-ọtọ, ma-ọbu ize-ndu, ma-ọbu mma-agha?


ma-ọbu ihe di elu, ma-ọbu ihe di omimi, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ ekère èkè, agaghi-apu ikewapu ayi n'ihu-n'anya Chineke, nke di nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.


N'ihi na ihu-n'anya Kraist nērugide ayi; ebe ayi nātule nka, na otù Onye nwuru n'ọnọdu madu nile, ya mere madu nile nwuru;


Akpọgidekọwo mu na Kraist n'obe; ọ bughi kwa mu onwem nādi ndu ọzọ, kama ọ bu Kraist nādi ndu nimem ma ndu ahu m'nādi n'anu-aru ub͕u a, anamadi ya n'okwukwe, bú nke m'kwere n'Ọkpara Chineke, Onye hurum n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihim.


nke bu aru-Ya, ozuzù nke Onye ahu Nke nāluzu ihe nile nime madu nile.


ka unu we nara ike ighọta, unu na ndi nsọ nile, ihe bu obodobo na ogologo na idi-elu na omimi,


nējeghari-kwa-nu n'ihu-n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra unu n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ayi, dika ihe echere n'iru Chineke na àjà achuru nye Ya ka ọ buru isisì nke ihe ísì utọ.


Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ-Ya n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ya;


dika o ziri ezi ka m'tukwasi uchem n'ihe a bayere unu nile, n'ihi na enwerem unu n'obim, ebe unu nile bu ndi nēsom n'inwekọ amara, ma nime ab͕um ma nime ngọpu nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike.


Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus.


ka unu jegharia n'uzọ kwesiri Onye-nwe-ayi ime otú ọ gātọ Ya utọ n'uzọ nile, nāmi nkpuru n'ezi ọlu nile ọ bula, nāba kwa uba nime nmazu nke Chineke;


Onye unu huru n'anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n'ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto:


Ma nābanu uba n'amara na ọmuma nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist. Ọ bu Ya ka otuto diri ma ub͕u a ma rue ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan