Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Efesọs 3:12 - Bible Nso

12 ọ bu kwa nime Ya ka ayi sitere n'okwukwe nke ayi kwere na Ya nwe nkwuwa-okwu na nkpọbata nime ntukwasi-obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 bụ onye anyị nwere ntụkwasị obi na obi siri ike ịbịakwute site nʼokwukwe anyị nwere na ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Efesọs 3:12
12 Iomraidhean Croise  

Jisus si ya, Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu.


ma ọ bu ezi omume Chineke, site n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n'ihi na ọ dighi ihe di iche;


Onye ayi sitewo-kwa-ra n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'okwukwe-ayi nime amara nka ayi nēguzo nime ya; ayi nānya kwa isi, nādabere n'olile-anya nke otuto Chineke.


Ntukwasi-obi di otú a ka ayi nwe-kwa-ra site n'aka Kraist n'ebe Chineke nọ:


n'ihi na ayi abua sitere n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'ebe Nna nọ nime otù Mọ Nsọ.


Ya mere unu etufula nkwuwa-okwu-unu, bú ihe nke nwere oké nnyeghachi nke ugwọ-ọlu.


ma Kraist kwesiri ntukwasi-obi dika Ọkpara, Nke bu onye-isi n'èzi-na-ulo-Ya; Onye ayi onwe-ayi bu èzi-na-ulo-Ya, ma ọ buru na ayi jidesie nkwuwa-okwu-ayi na inya-isi nke olile-anya-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile.


N'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu bayere nmehie, nání otù mb͕e, Onye ezi omume n'ihi ndi ajọ omume, ka O we kuru ayi biakute Chineke; n'ihi na emere ka Ọ nwua anwu n'anu-aru-Ya, ma emere ka Ọ di ndu na mọ-Ya;


Umu-ntakirim, nānọgide-kwa-nu nime Ya ub͕u a; ka ọ gābu, ma ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu, ghara kwa iwere ihere pua n'iru Ya n'ọbibia-Ya.


Ndi m'huru n'anya, ọ buru na obi-ayi amaghi ayi ikpé, ayi nwere nkwuwa-okwu n'ebe Chineke nọ;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan