Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 9:4 - Bible Nso

4 Ewe gwa ha ka ha ghara imejọ ahihia nke uwa, ma-ọbu ihe ọ bula nwere akwukwọ ndu, ma-ọbu osisi ọ bula, ma ka ha mejọ nání madu, bú ndi ahu nēnweghi akàrà nke Chineke n'egedege-iru-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 E nyere ha iwu si ha emebila ahịhịa ndụ ọbụla, maọbụ osisi na ihe ọbụla a kụrụ nʼala. Kama ọrụ ha bụ ịbịakwasị mmadụ ọbụla na-enweghị akara Chineke nʼegedege ihu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 9:4
15 Iomraidhean Croise  

Ọ̀ bughi Gi onwe-gi b͕aworo ya, b͕a-kwa-ra ulo-ya, b͕a-kwa-ra ihe nile o nwere, ogige buruburu? I gọziwo ọlu aka-ya abua, ihe-nnweta-ya ab͕asawo kwa n'ala.


Jehova we si Setan Le, ihe nile o nwere di n'aka-gi; nání esetila aka-gi metu aru-ya. Setan we si n'iru Jehova pua.


Jehova we si Setan, Le, ọ nọ n'aka-gi; nání debe ndu-ya.


N'ihi na ọnuma madu gēkele Gi: I gēji ọnuma nile nke fọduru ke n'úkwù.


N'ihi na Jehova gāgabiga iti ndi Ijipt ihe; ma mb͕e Ọ huru ọbara ahu n'elu elu-uzọ na n'elu awara-uzọ abua, Jehova gāgabiga ọnu-uzọ ahu, Ọ gaghi-ekwe onye-nbibì ahu ka ọ ba n'ulo-unu iti unu ihe.


Jehova we si ya, Gabiga n'etiti obodo a, n'etiti Jerusalem, ka akàrà n'egedege-iru nke ndi ahu ndi nēze ume ndi nāsu kwa ude n'ihi ihe-árú nile nke anēme n'etiti ya.


b͕usisianu okenye na okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke na umu-ntakiri na ndinyom: ma unu abiarula nso onye ọ bula nke akàrà ahu di ya n'iru; ma n'ebe nsọm ka unu gēsi malite. Ha we malite n'etiti ndi-okenye ndi nọ n'iru ulo ahu.


N'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama uku di iche iche na ọlu-ebube uku di iche iche; iduhie ọbuná ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.


Unu eme-kwa-la ihe gēwuta Mọ Nsọ nke Chineke, Onye akara unu akàrà nime Ya rue ubọchi nb͕aputa.


M'we hu, ma le, Nwa-aturu ahu ka Ọ nēguzo n'ugwu Zaion, Ya na ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, bú ndi edeworo aha-Ya na aha Nna-Ya n'egedege-iru-ha.


M'we nu dika agāsi na ọ bu otu n'etiti ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Otù ọtùtù ntà nke ọkà bu otù shilling, ọtùtù ntà atọ nke barley bu otù shilling; emejọ-kwa-la manu na manya-vine.


Mb͕e nka gasiri m'we hu ndi-mọ-ozi anọ ka ha nēguzo n'elu nkuku anọ nke uwa, nējidesi ifufe anọ nke uwa ike, ka ifufe ọ bula we ghara ife n'elu uwa, ma-ọbu n'elu oké osimiri, ma-ọbu n'elu osisi ọ bula.


Onye mbu we fùa opì, ákú-miri-ígwé na ọku we so, nke agwarari ọbara, ewe tubà ha n'uwa: ọku we b͕achasia otù uzọ n'uzọ atọ nke uwa, ọku b͕achasi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke osisi, ọku b͕achasi-kwa-ra ahihia ndu nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan