Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 9:15 - Bible Nso

15 Ewe tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu, ndi edoziriri nye oge hour na ubọchi na ọnwa na arọ ahu, ka ha we b͕ue otù uzọ n'uzọ atọ nke madu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 A tọhapụrụ ndị mmụọ ozi anọ ahụ, ndị e jibu eji na njikere maka oge awa ahụ, na ụbọchị ahụ, na ọnwa ahụ, na afọ ahụ, iji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 9:15
9 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi, agātọpu Setan n'ulo-nkpọrọ-ya,


Mọ-ozi nke-atọ we fùa opì, oké kpakpando we site n'elu-igwe da, nke nēre ọku dika ọwa, o we da n'elu otù uzọ n'uzọ atọ nke osimiri nile, da kwa n'elu isi-iyi miri nile;


Onye mbu we fùa opì, ákú-miri-ígwé na ọku we so, nke agwarari ọbara, ewe tubà ha n'uwa: ọku we b͕achasia otù uzọ n'uzọ atọ nke uwa, ọku b͕achasi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke osisi, ọku b͕achasi-kwa-ra ahihia ndu nile.


Mọ-ozi nke-abua we fùa opì, ewe tubà ihe dika oké ugwu nke nēre ọku nime oké osimiri: otù uzọ n'uzọ atọ nke oké osimiri we ghọ ọbara;


otù uzọ n'uzọ atọ nke ihe nile ekère èkè nke di n'oké osimiri we nwua, bú ihe nwere ndu; emebi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke ub͕ọ nile.


Ha nwe-kwa-ra ọdudù yiri ọdudù akpi, nwe ihe-ọb͕ub͕a; nime ọdudù-ha ike-ha di imejọ madu ọnwa ise.


Esitere n'ihe-otiti atọ ndia b͕u otù uzọ n'uzọ atọ nke madu nile, ya bu site n'ọku ahu na anwuru-ọku ahu na brimstone ahu, nke nēsi n'ọnu-ha puta.


Ewe nye ha ike ka ha ghara ib͕u ha, kama ka ewe mekpa ha aru ọnwa ise: nmekpa-aru-ha di ka nmeka-aru nke akpi, mb͕e ọ bula ọ nāb͕a madu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan