Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 9:11 - Bible Nso

11 Ha nwere mọ-ozi ahu nke abyss ahu dika eze-ha: aha-ya n'asusu Hibru bu Abadon, n'asusu Grik o nwe-kwa-ra aha Apọlion.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ha nwere mmụọ ozi nke Abis, onye na-achịkọta ha dịka eze. Aha ya nʼasụsụ Hibru bụ Abadọn, ma nʼasụsụ Griik ọ bụ Apolion.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 9:11
18 Iomraidhean Croise  

Ala-mọ b͕a ọtọ n'iru Ya, Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ebe-ila-n'iyì nwere.


Ebe-ila-n'iyì na ọnwu siri, Na nti-ayi ka ayi nuworo akukọ-ya.


N'ihi na ọku ka ọ bu, rue ebe-ila-n'iyì ka ọ nēripia, Ọ gēropu kwa ihe-ọmumem nile.


Àgākọ akukọ ebere-Gi n'ílì? Àgākọ akukọ ikwesi-ntukwasi-obi-Gi n'ebe-ila-n'iyì?


Ala-mọ na ebe-ila-n'iyì di n'iru Jehova? Òbi umu madu gēsi aṅa ghara idi n'iru Ya?


Ha we riọ Ya ka ọ ghara inye ha iwu ka ha je ba n'abyss.


Ub͕u a ka ikpé uwa nka di: ub͕u a ka agāchupu onye-isi uwa nka.


Ọ dighi ọtutu okwu Mu na unu gēkwu ọzọ site n'ub͕u a, n'ihi na onye-isi nke uwa nka nābia: ọ dighi kwa ihe ọ bula o nwere nimem;


ikpé, n'ihi na ekpewo onye-isi uwa nka ikpé.


Ma ọdọ-miri ntà di na Jerusalem n'akuku ọnu-uzọ-ama nke aturu, nke anākpọ n'asusu Hibru Betesda, nke nwere ulo-ìbà ise.


Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya.


ndi chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndi nēkweghi ekwe kpu ìsì n'etiti ha, ka inye-ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraist, Onye bu onyinyo Chineke, we ghara iwakwasi ha.


nke unu jeghariri nime ha n'oge gara aga n'uzọ oge nke uwa nka, dika onye-isi nke ike nke mbara-elu-igwe si chọ, bú mọ ahu nke nālusi ọlu ike nime umu nke ekweyeghi-ekwenye ub͕u a;


Umu-ntakirim, unu onwe-unu bu ndi siri na Chineke puta, unu emeriwo kwa ha: n'ihi na Onye ahu Nke nọ nime unu ka onye ahu nke nọ n'uwa uku.


Ayi matara na ayi bu ndi si na Chineke puta, uwa dum nātọb͕ọ kwa n'aka ajọ onye ahu.


Ewe chudà dragon uku ahu, bú agwọ ochie ahu, onye anākpọ Ekwensu na Setan, onye nēduhie uwa nile madu bi; achudara ya n'uwa, chudà kwa ndi-mọ-ozi-ya, ha na ya.


Ha we me ka ha zukọ n'ebe ahu nke anākpọ n'asusu Hibru Amagedọn.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan