Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 7:15 - Bible Nso

15 N'ihi nka ka ha nọ n'iru oche-eze Chineke; ha nēfè kwa Ya òfùfè ehihie na abali n'ulo nsọ Ya: Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu gāb͕asa kwa ulo-ikwū-Ya n'isi-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ọ bụ nke a mere, “ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya. Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ ga-ekpuchikwa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 7:15
25 Iomraidhean Croise  

M'gēbi kwa n'etiti umu Israel, M'gaghi-arapu kwa ndim, bú Israel.


N'ihi na Devid siri, Jehova, bú Chineke Israel, emewo ka ndi-Ya zuru ike; Ọ nēbi kwa nime Jerusalem rue mb͕e ebighi-ebi:


M'gēbi kwa n'etiti umu Israel, M'gābu-kwa-ra ha Chineke.


Ebe-obibim gādi kwa n'elu ha, M'gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi.


M'gētiye ebe-obibim n'etiti unu: nkpuru-obim agaghi-asọ kwa unu oyi.


Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.


Ùnu amataghi na unu bu ulo nsọ Chineke, Mọ nke Chineke bi kwa nime unu?


Ọzọ, òle nkwekọ ulo nsọ nke Chineke na arusi nēkwekọ? n'ihi na ayi onwe-ayi bu ulo nsọ nke Chineke di ndu; dika Chineke kwuru, si, M'gēbi nime ha, nējeghari kwa nime ha; M'gābu kwa Chineke nke ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nkem.


nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke.


Ma isi ihe n'ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n'aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe,


Ewe meghe ulo nsọ nke Chineke nke di n'elu-igwe; ewe hu ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu-Ya n'ulo nsọ Ya; àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, na ala-ọma-jijiji, na oké ákú-miri-ígwé we so.


O we saghe ọnu-ya ikwulu Chineke, ikwulu aha-Ya, na ulo-ikwū-Ya, bú ndi bi n'elu-igwe.


Ekwensu ahu nke nēduhie ha, atubàra ya nime ọdọ ọku na brimstone, ebe anu-ọhia ahu na onye-amuma ugha ahu nọ kwa; agēmekpa kwa ha aru ehihie na abali rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Ọ dighi kwa ulo nsọ ọ bula m'huru nime ya: n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Ya na Nwa-aturu ahu, bu ulo nsọ ya.


Ọbubu-ọnu ọ bula agaghi-adi ọzọ: oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu gādi kwa nime ya: ndi-orù-Ya gēfè kwa Ya òfùfè:


Abali agaghi-adi kwa ọzọ; ìhè oriọna na ìhè anyanwu adighi kwa ha nkpà; n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke gēnye ha ìhè: ha ganābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Orú oche-eze na anọ di kwa oche-eze ahu gburugburu: m'we hu orú ndi-okenye na anọ ka ha nānọkwasi n'oche-eze ndia, ndi eb͕okwasiworo uwe ọcha; ahu-kwa-ram okpu-eze nke ọla-edo n'isi-ha.


Ihe anọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra nkù isi n'otù n'otù, ha juputa-kwa-ra n'anya anya gburugburu, ya na nime: ha adighi-ezu ike ehihie na abali, nāsi, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye ahu di, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye diri, Onye nādi kwa adi, Onye nābia kwa.


Mb͕e ọ bula ihe anọ ahu nke di ndu gēnye Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu otuto na nsọpuru na ekele, bú Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi,


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan