Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 7:14 - Bible Nso

14 M'we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n'oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 7:14
30 Iomraidhean Croise  

N'ihi na gi onwe-gi gēchezọ ọnọdu ọjọ gi, Dika miri nke gabigara agabiga ka i gēcheta ya:


O we wuara ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, n'ukwu anọ ya; bú nb͕a-aka abua n'otù akuku-ya, na nb͕a-aka abua n'akuku-ya ọzọ.


Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe Jehova nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi.


Ọzọ, ufọdu nime ndi ahu nwere uche gāsu ngọngọ, inucha ha, na ime ka ha di ọcha, na ime ka ha nwue ọcha, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: n'ihi na ọ fọduru idi na mb͕e akara àkà.


Ma na mb͕e ahu ka Maikael gēguzo ọtọ, bú onye-isi uku ahu nke nēguzo n'akuku umu ndi-gi: mb͕e ahuhu gādi kwa, nke mb͕e di otú ahu nādighi site na mb͕e mba ọ bula malitere idi rue mb͕e ahu: ma na mb͕e ahu ka agēme ka ndi-gi wepuga onwe-ha, bú onye ọ bula agāhu na edeworo aha-ya n'akwukwọ.


Abiarurum nso otù onye nime ndi ahu nēguzo ọtọ n'ebe ahu, ọ bu kwa ihe bu ezi okwu bayere ihe a nile ka m'riọrọ n'aka ya. O we gwam okwu, ọ bu kwa isi ọhù ndia ka o mere ka m'mara, si:


N'ubọchi ahu isi-iyi gādi nke ghere oghe nye ulo Devid, nye kwa ndi bi na Jerusalem, bayere nmehie baye-kwa-ra ọrurú.


n'ihi na mb͕e ahu ka nkpab͕u uku gādi, nke ihe dika ya akādighi site na nmalite uwa rue mb͕e a, é-è, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.


N'ihi na mb͕e ahu gābu nkpab͕u, nke aha nkpab͕u di otú a akādighi site na nmalite òkìkè-uwa nke Chineke kère rue mb͕e a, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.


Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka unu we nwe udo nimem. N'uwa unu nēnwe nkpab͕u: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa.


nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n'okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n'ọtutu nkpab͕u ba n'ala-eze Chineke.


Ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi nime nkpab͕u-ayi nile: ebe ayi matara na nkpab͕u nāluta ntachi-obi;


Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi.


ya mere ayi onwe-ayi nānya isi n'aru unu n'etiti nzukọ Chineke nile n'ihi ntachi-obi-unu na okwukwe-unu nime nsob͕u-unu nile na nime nkpab͕u nile unu nānagide;


N'ihi nka Jisus, ka O we site n'ọbara nke Ya onwe-ya do ndi nke Ya nsọ, Ọ hu-kwa-ra ahuhu n'azu ọnu-uzọ-ama nke obodo.


ọ̀bara Kraist, Onye sitere n'aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n'iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n'ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu?


kama eji ọbara di oké ọnu-ahia, dika nke nwa-aturu nke ọlu ma-ọbu ntupọ nādighi ya n'aru, bú ọbara nke Kraist:


ma ọ buru na ayi ejegharia n'ìhè ahu, dika Ya onwe-ya nọ n'ìhè ahu, ayi nēnwekọrita ihe n'etiti onwe-ayi, ọbara Jisus, bú Ọkpara-Ya, nāsachapu kwa ayi nmehie nile.


nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n'anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya;


Ndi ahu we merie ya n'ihi ọbara Nwa-aturu ahu, na n'ihi okwu àmà-ha; ha ahughi kwa ndu-ha n'anya rue ọnwu.


M'we hu dika agāsi na ọ bu oké osimiri eji enyo me nke agwakọworo ya na ọku; ahu-kwa-ram ndi nāputa n'aka anu-ọhia ahu na nmeri, ya na n'aka ihe-oyiyi-ya, na n'aka ọnu-ọgugu aha-ya, ka ha nēguzo n'usọ oké osimiri ahu eji enyo me, nēnwe ubọ-akwara nke Chineke.


M'we hu nwanyi ahu ka ọbara ndi nsọ na ọbara ndi-àmà Jisus nābà ya n'anya dika manya. Mb͕e m'huru ya o we jum anya nke-uku.


Amataram nkpab͕u-gi, na ob͕eye i bu (ma i bu ọgaranya), na nkwulu Chineke nke ndi nāsi na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha bu ulo-nzukọ Setan.


Ngọzi nādiri ndi nāsa uwe-nwuda-ha, ka ha we nwe ike n'ebe osisi nke ndu ahu di, si kwa n'ọnu-uzọ-ama ahu ba nime obodo ahu.


Ha nābù kwa abù ọhu, si, I kwesiri inata akwukwọ ahu, na isaghe akàrà-ya: n'ihi na eb͕uru Gi eb͕u, I were kwa ọbara-Gi b͕atara Chineke madu si n'ebo nile ọ bula, na asusu nile ọ bula, na ndi nile ọ bula, na mba nile ọ bula, puta,


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan