Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 7:10 - Bible Nso

10 ha we were oké olu tie nkpu, si, Nzọputa diri Chineke-ayi, Onye nānọkwasi n'oche-eze ahu, di-kwa-ra Nwa-aturu ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị, “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 7:10
26 Iomraidhean Croise  

Ọ bughi ayi, Jehova, ọ bughi ayi, Kama ọ bu aha-Gi ka I gēnye nsọpuru, N'ihi ebere-Gi, na n'ihi ezi-okwu-Gi.


Jehova nwe nzọputa: Ka ngọzi-Gi dikwasi ndi-Gi. Selah


Ma nzọputa ndi ezi omume nēsi n'aka Jehova bia: Ọ bu ebe-ha siri ike na mb͕e nkpà.


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Jehova; ọ dighi kwa onye-nzọputa di ma-ọbughi náním.


N'ezie Gi onwe-gi bu Chineke Nke nēzobe Onwe-gi, Gi Chineke Israel, bú Onye-nzọputa.


Gosinu, weta-kwa-nu ha nso; e, ka ha b͕akọ ìzù n'otù: ònye mere ka anu ihe a site na mb͕e gara aga? onye sitere na mb͕e ochie gosi ya? ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova? ọ dighi kwa Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem; Chineke Nke nēme ezi omume na onye-nzọputa adighi ma ewezuga nání Mu onwem.


N'ezie n'efu ka nzọputa ahu bu nke anēle anya ya site n'ugwu ntà di iche iche, bú ìgwè madu n'elu ugwu nile: n'ezie na Jehova, bú Chineke-ayi, ka nzọputa Israel di.


Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n'ala Ijipt; ọ dighi kwa chi, ma-ọbughi náním, i gāmara, onye-nzọputa adighi kwa, ma-ọbughi náním.


Ma mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà; Ihe nke m'kweworo na nkwa ka m'gākwughachi. Nzọputa diri Jehova.


Ònye ka i bu, gi oké ugwu? n'iru Zerubabel i gāghọ ebe di lari: ọ gēweputa kwa nkume nke-elu n'itiri ya oké nkpu, si, Amara, amara.


Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.


Madu nile gāhu kwa nzọputa Chineke.


N'echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!


o we le Jisus anya ka Ọ nējeghari, ọ si, Le, Nwa-aturu Chineke!


Unu onwe-unu nākpọ isi ala nye ihe unu nāmatagh: ayi onwe-ayi nākpọ isi ala nye ihe ayi matara: n'ihi na nzọputa si n'etiti ndi-Ju puta.


n'ihi na ọ bu amara ka ejiworo zọputa unu, site n'okwukwe; nka esiteghi kwa n'onwe-unu: ọ bu onyinye Chineke:


M'we nu oké olu ka ọ nādà n'elu-igwe, si, Ub͕u a ka ọ biaworo, bú nzọputa ahu, na ike ahu, na ala-eze Chineke-ayi, na ichi-isi nke Kraist-Ya: n'ihi na achudara onye ahu nke nēbo umu-nna-ayi ebubo, onye nēbo ha ebubo n'iru Chineke-ayi ehihie na abali.


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we nu ihe dika oké olu nke oké ìgwè ndi nọ n'elu-igwe, nāsi, Haleluya; Nzọputa nile na otuto nile na ike nile nādiri Chineke-ayi:


Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu we si, Le, anameme ihe nile ka ha di ọhu. O we si, De akwukwọ: n'ihi na okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu.


Ọbubu-ọnu ọ bula agaghi-adi ọzọ: oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu gādi kwa nime ya: ndi-orù-Ya gēfè kwa Ya òfùfè:


ihe di kwa n'iru oche-eze ahu dika oké osimiri eji enyo me yiri crystal; ihe anọ nke di ndu nọ kwa n'etiti oche-eze ahu, nọ kwa oche-eze ahu gburugburu, ndi juputara n'anya anya n'iru na azu.


O we bia, Ọ narawo kwa akwukwọ ahu n'aka-nri Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan