Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 6:2 - Bible Nso

2 M'we hu, ma le, inyinya ọcha, Onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra uta; ewe nye Ya okpu-eze: O we puta nēmeri, ya na ka O we meri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Mgbe m lere anya, ahụrụ m ịnyịnya dị ọcha. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ụta nʼaka ya. A tụkwasịkwara okpueze nʼisi ya dịka onye agha na-emeri emeri mgbe niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 6:2
22 Iomraidhean Croise  

Nkpa-n'aka nke ike-gi ka Jehova gēsi na Zaion ziputa: Gi nwe ike n'aru madu n'etiti ndi-iro-gi.


Gi onwe-gi, Onye anātu egwu ka I bu: Ọzọ, ònye gēguzo n'iru Gi site na mb͕e I were iwe?


Bùkuenu Jehova abù ọhu; N'ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche; Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa.


O lodawo ọnwu rue mb͕e ebighi-ebi; Onye-nwe-ayi Jehova gēhichapu kwa anya-miri n'iru nile; ita-uta nke ndi-Ya ka Ọ gēwezuga kwa n'elu uwa nile: n'ihi na Jehova ekwuwo ya.


Ahurum n'abali, ma, le otù onye nke nānọkwasi inyinya nācha uhie uhie, onye ahu nēguzo kwa n'etiti osisi myrtle nke di n'ebe miri emi; n'azu ya ka inyinya di iche iche guzoro, nke nācha uhie uhie, na nke nācha dika manu, na nke nācha ọcha.


Jisus we biakute ha, gwa ha okwu, si, Ewerewo ike nile di n'elu-igwe na n'elu uwa nyem.


N'ihi na Ọ ghaghi ibu eze, rue mb͕e Ọ gēdebewori ndi-iro-Ya nile n'okpuru ukwu-Ya.


Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Mba nile we we iwe, iwe-Gi we bia, ya na oge ikpe ndi nwuru anwu ikpé, na inye ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, na ndi nsọ, na ndi nātu egwu aha-Gi, ndi ntà na ndi uku, ugwọ-ọlu-ha; na imebi ndi ahu nēmebi uwa.


M'we hu, ma le, ígwé ọcha; n'elu ígwé ọcha ahu ka m'huru otù Onye yiri nwa nke madu ka Ọ nānọdu ala, nēkpu okpu-eze nke ọla-edo n'isi-Ya, mma-iwe-ihe-ubi di nkọ di kwa n'aka-Ya.


M'we hu dika agāsi na ọ bu oké osimiri eji enyo me nke agwakọworo ya na ọku; ahu-kwa-ram ndi nāputa n'aka anu-ọhia ahu na nmeri, ya na n'aka ihe-oyiyi-ya, na n'aka ọnu-ọgugu aha-ya, ka ha nēguzo n'usọ oké osimiri ahu eji enyo me, nēnwe ubọ-akwara nke Chineke.


Ndia gēbu agha megide Nwa-aturu ahu, Nwa-aturu ahu gēmeri kwa ha, n'ihi na Ọ bu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, na Eze kachasi ndi-eze nile; ndi soro Ya gēmeri kwa, bú ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi.


Usu nile nke ndi-agha ndi di n'elu-igwe we so Ya n'elu inyinya ọcha, nēyi ezi ákwà ọcha, nke di ọcha nēnwu kwa enwu.


Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o som nọdu ala n'oche-ezem, dika Mu onwem meri-kwa-ra, we so Nnam nọdu ala n'oche-eze-Ya.


Oyiyi igurube ahu yiri inyinya edoziworo ije agha; n'isi-ha ka ha nēkpu ihe dika okpu-eze yiri ọla-edo, iru-ha di kwa ka iru madu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan