Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 6:11 - Bible Nso

11 Ewe nye ha n'otù n'otù uwe-nwuda di ọcha; ewe si ha, ka ha zuru ike nwa oge ọzọ, rue mb͕e ndi-orù-ibe-ha na umu-nna-ha gēzu kwa ezù, bú ndi agaje ib͕u dika eb͕u-kwa-ra ha onwe-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 E nyere ha nʼotu nʼotu uwe ọcha, a gwakwara ha ka ha zuru ike nwa oge nta, tutu ruo mgbe ọnụọgụgụ ndị ozi ibe ha na ụmụnna ha a ga-egbu dịka e gburu ha ga-ezu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 6:11
19 Iomraidhean Croise  

Ma gi onwe-gi, la, rue ọgwugwu ihe ndia: i gēzu kwa ike, guzo ọtọ n'ebe ekeworo nye gi, n'ọgwugwu ubọchi ndia.


Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye: umu gēbili kwa megide ndi muru ha, me ka ha nwua anwu.


Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n'aka-ya, na akpukpọ-ukwu n'ukwu-ya:


Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.


Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n'ebe mu onwem nọ, ka m'we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m'natara n'aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke.


na inyeghachi unu, bú ndi anākpab͕u, aru-efè, ayi na unu, nime nkpughe nke Onye-nwe-ayi Jisus site n'elu-igwe, Ya na ndi-mọ-ozi nke ike-Ya,


Ab͕asiwom nb͕a ọma ahu, ab͕asiwom ọsọ ahu, edebesiwom okwukwe ahu:


n'ihi na Chineke buru uzọ leputa ihe ka nma bayere ayi, ka aghara ime ka ha zue okè ma asi na ayi anọghi ya.


bú nb͕akọ ọra ndi-mọ-ozi nile, na nzukọ nke ndi eburu uzọ muputa ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ n'elu-igwe, na Chineke, bú Onye-ikpé ọra madu, na mọ nke ndi ezi omume emeworo ka ha zue okè,


N'ihi na onye bataworo n'izu-ike-ya, ya onwe-ya ezuwo kwa ike n'ọlu-ya nile, dika Chineke zuru ike n'ọlu nke aka Ya.


we were Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, bú Onye kère elu-igwe na ihe nile di ya nime, na uwa na ihe nile di ya nime, na oké osimiri na ihe nile di ya nime, ṅu iyi na oge agaghi-adi kwa ọzọ:


Ewe nye ya ike inye ya ume, bú ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu, ka ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu we kwue okwu, me kwa ka eb͕ue ha, ka ha ra, bú ndi ọ bula nākpọghi isi ala nye ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu.


M'we nu olu ka ọ nēsi n'elu-igwe da, si, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi nwuru anwu, bú ndi gānwu anwu nime Onye-nwe-ayi site n'ub͕u a: e, ka Mọ Nsọ nēkwu, ka ha we si na ndọb͕u nile ha dọb͕uru onwe-ha n'ọlu zuru ike; n'ihi na ọlu nile ha nēso ha ga.


M'we hu nwanyi ahu ka ọbara ndi nsọ na ọbara ndi-àmà Jisus nābà ya n'anya dika manya. Mb͕e m'huru ya o we jum anya nke-uku.


M'we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n'oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan