Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 5:8 - Bible Nso

8 Mb͕e Ọ natara akwukwọ ahu, ihe anọ ahu nke di ndu na orú ndi-okenye na anọ ahu we da n'ala n'iru Nwa-aturu ahu, ha nile n'otù n'otù nwere ubọ-akwara, na ọkwa nke eji ọla-edo me nke juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nke bu ekpere ndi nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Mgbe ọ weere ya, anụ anọ ahụ dị ndụ na iri ndị okenye abụọ na anọ ndị ahụ dara nʼala nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha niile nʼotu nʼotu jikwa ụbọ akwara na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe jupụtara nʼime ha bụ ụda na-esi isi ụtọ, bụ ekpere ndị nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 5:8
27 Iomraidhean Croise  

Ka edozie ekperem dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Gi; Ka nchili ọbu-akam buru onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.


Werenu ọfufù opì-ike to Ya: Chirinu une na ubọ-akwara to Ya.


Werenu ubọ-akwara kele Jehova: Werenu une nke akwara iri bùkue Ya abù ọma.


M'gābiaru kwa ebe-ichu-àjà nke Chineke, Rue Chineke aru, bú ọṅù nke otite-egwú-ọṅùm: M'gēkele kwa Gi n'ubọ-akwara, Chineke, bú Chinekem.


Bulienu abù ọma, weta kwa egwú-otiti, Na ubọ-akwara di utọ, ya na une.


na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ;


N'echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!


ka madu nile we sopuru Ọkpara ahu, dika ha nāsọpuru Nna-Ya. Onye nādighi-asọpuru Ọkpara adighi-asọpuru Nna Nke zitere Ya.


Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya.


Ndi nile ndi bi n'elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n'akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n'oge itọ ntọ-ala nke uwa.


M'we hu dika agāsi na ọ bu oké osimiri eji enyo me nke agwakọworo ya na ọku; ahu-kwa-ram ndi nāputa n'aka anu-ọhia ahu na nmeri, ya na n'aka ihe-oyiyi-ya, na n'aka ọnu-ọgugu aha-ya, ka ha nēguzo n'usọ oké osimiri ahu eji enyo me, nēnwe ubọ-akwara nke Chineke.


Otù nime ihe anọ ahu nke di ndu we nye ndi-mọ-ozi asa ahu ọkwa ọla-edo asa juputara n'ọnuma Chineke, Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Orú ndi-okenye na anọ ahu na ihe anọ ahu nke di ndu we da n'ala, kpọ isi ala nye Chineke, bú Onye nānọkwasi n'oche-eze ahu, si, Amen; Haleluya.


orú ndi-okenye na anọ ahu gāda n'ala n'iru Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, ha gākpọ kwa isi ala nye Ya, bú Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, ha gātudà kwa okpu-eze-ha n'iru oche-eze ahu, nāsi,


Orú oche-eze na anọ di kwa oche-eze ahu gburugburu: m'we hu orú ndi-okenye na anọ ka ha nānọkwasi n'oche-eze ndia, ndi eb͕okwasiworo uwe ọcha; ahu-kwa-ram okpu-eze nke ọla-edo n'isi-ha.


ihe di kwa n'iru oche-eze ahu dika oké osimiri eji enyo me yiri crystal; ihe anọ nke di ndu nọ kwa n'etiti oche-eze ahu, nọ kwa oche-eze ahu gburugburu, ndi juputara n'anya anya n'iru na azu.


Ihe anọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra nkù isi n'otù n'otù, ha juputa-kwa-ra n'anya anya gburugburu, ya na nime: ha adighi-ezu ike ehihie na abali, nāsi, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye ahu di, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye diri, Onye nādi kwa adi, Onye nābia kwa.


M'we hu, nu kwa olu ọtutu ndi-mọ-ozi ndi nọ oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu gburugburu; ọnu-ọgugu-ha riri oké nne nke-uku, nke anāpughi iguta ha;


anurum ka ha were oké olu nāsi, O kwesiri, bú Nwa-aturu ahu Nke eb͕uworo eb͕u, inata ike nile, na àkù, na amam-ihe, na ume, na nsọpuru, na otuto, na ngọzi.


Ihe anọ nke di ndu we si, Amen. Ndi-okenye ahu we da n'ala we kpọ isi ala.


M'we hu Nwa-aturu ka O nēguzo n'etiti oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu, guzo kwa n'etiti ndi-okenye ahu, dika agāsi na eb͕uru Ya-ri, O nwe-kwa-ra mpi asa, na anya asa, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke, bú nke ezigaworo ha n'uwa nile.


M'we hu mb͕e Nwa-aturu ahu saghere otù nime akàrà asa ahu, m'we nu otù nime ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, dika agāsi na o ji olu éb͕è-elu-igwe nēkwu, si, Bia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan