Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 5:5 - Bible Nso

5 otù onye n'etiti ndi-okenye ahu we sim, Akwala ákwá: le, Ọdum ahu Nke si n'ebo Juda puta, Onye bu Nkpọrọgwu nke Devid, O kwesiri, isaghe akwukwọ ahu na akàrà-ya asa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Mgbe ahụ, otu onye nʼime ndị okenye ahụ gwara m sị, “Akwala akwa. Lee, Ọdụm ebo Juda, bụ mgbọrọgwụ Devid, emeriela. Ọ pụrụ ịnyakapụ akara asaa ahụ ma saghekwaa akwụkwọ ahụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 5:5
25 Iomraidhean Croise  

Ọdum iri na abua we nēguzo n'ebe ahu n'elu ihe-nrigo isi ahu n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ: emeghi ya otú a nye ala-eze ọ bula.


Oche-eze ahu nwere ihe-nrigo isi, na ihe-nb͕akwasi-ukwu eji ọla-edo me, ejikọrọ ha na oche-eze ahu, aka di kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ n'elu ebe ọnọdu-ya, ọdum abua nēguzo kwa n'akuku aka ahu.


Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya, Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya.


Ome gēsi kwa n'ogwe-osisi Jesi puta, otù alaka nke sitere na nkpọrọgwu-ya gāmi kwa nkpuru:


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na nkpọrọgwu Jesi, nke nēguzo ibu ọkọlọtọ ndi nile di iche iche, ya ka mba nile gāju ase; ebe-izu-ike-ya gābu kwa ebube.


Otú a ka Jehova siri: Jide olu-gi ka ọ ghara ikwa ákwá, jide kwa anya-gi abua ka ha ghara ib͕a anya-miri: n'ihi na ugwọ-ọlu di agākwu gi n'ọlu-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ha gēsi kwa n'ala onye-iro lata.


Abiarurum nso otù onye nime ndi ahu nēguzo ọtọ n'ebe ahu, ọ bu kwa ihe bu ezi okwu bayere ihe a nile ka m'riọrọ n'aka ya. O we gwam okwu, ọ bu kwa isi ọhù ndia ka o mere ka m'mara, si:


Ọ makpuru, o dinara dika ọdum, Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie? Onye ọ bula nke nāgọzi gi bu onye agọziri agọzi, Onye ọ bula nke nābu gi ọnu bu kwa onye anābu ọnu.


Ma Jisus chighariri n'ebe ha nọ, si, Umu-nwanyi Jerusalem, unu akwalaram ákwá, kama nākwaranu onwe-unu na umu-unu.


Mb͕e Onye-nwe-ayi huru ya, O we nwe ọmiko n'aru ya, si ya, Akwala ákwá.


Ma madu nile nākwa ákwá, nēti kwa aka n'obi n'ihi ya: ma Ọ siri, Unu akwala ákwá; n'ihi na ọ nwughi anwu, kama ọ nāraru ura.


Ndi ahu we si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? Ọ si ha, N'ihi na ha bupuru Onye-nwem, amatakwaghm ebe ha tọb͕ọrọ Ya.


bayere Okpara-Ya, Onye amuru site na nkpuru Devid dika anu-aru si di,


Ọzọ kwa, Aisaia si, Nkpọrọgwu ahu nke Jesi gādi, Na onye ahu Nke nēbili ibu onye-isi mba nile; Onye ahu ka ndi mba ọzọ gēle anya Ya.


N'ihi na ọ putawo ìhè na Onye-nwe-ayi esiwo na Juda rọputa; bú ebo nke Moses nēkwughi ihe ọ bula bayere ndi-nchu-àjà nye ya.


Nkpughe nke Jisus Kraist, nke Chineke nyere Ya igosi ndi-orù-Ya, bú ihe nāghaghi iputa n'isi nso: O we site n'aka mọ-ozi-Ya ziga we gosi Jọn orù-Ya;


Mu onwem, bú Jisus, zitere mọ-ozim iwere ihe ndia b͕ara unu àmà nye nzukọm nile. Mu onwem bu nkpọrọgwu Devid, buru kwa nwa ọ muru, kpakpando nēnwu enwu, nke bu kwa kpakpando ututu ahu.


Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o som nọdu ala n'oche-ezem, dika Mu onwem meri-kwa-ra, we so Nnam nọdu ala n'oche-eze-Ya.


orú ndi-okenye na anọ ahu gāda n'ala n'iru Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, ha gākpọ kwa isi ala nye Ya, bú Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, ha gātudà kwa okpu-eze-ha n'iru oche-eze ahu, nāsi,


Orú oche-eze na anọ di kwa oche-eze ahu gburugburu: m'we hu orú ndi-okenye na anọ ka ha nānọkwasi n'oche-eze ndia, ndi eb͕okwasiworo uwe ọcha; ahu-kwa-ram okpu-eze nke ọla-edo n'isi-ha.


M'we kwa ákwá nke-uku, n'ihi na ahughi onye ọ bula kwesiri isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya:


M'we hu mb͕e Nwa-aturu ahu saghere otù nime akàrà asa ahu, m'we nu otù nime ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, dika agāsi na o ji olu éb͕è-elu-igwe nēkwu, si, Bia.


Otù n'etiti ndi-okenye ahu we za, sim, Ndia ndi eb͕okwasiworo uwe-nwuda ahu di ọcha, hà bu ole ndi, òle ebe ha si bia kwa?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan