Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 4:7 - Bible Nso

7 Ihe mbu ahu nke di ndu yiri ọdum, ihe nke-abua ahu nke di ndu yi-kwa-ra nwa-ehi, ihe nke-atọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra iru dika nke madu, ihe nke-anọ ahu nke di ndu yi-kwa-ra ugo nēfe efe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Nke mbụ nʼime anụ ndị ahụ dị ndụ nwere oyiyi dịka ọdụm. Nke abụọ dịka ehi. Nke atọ nwere ihu yiri nke mmadụ. Nke anọ dịka ugo gbasapụrụ nku ya na-efe efe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 4:7
20 Iomraidhean Croise  

Nwa-ọdum ka Juda bu; N'anu adọb͕uru, nwam, ka i siworo rigo; O ruru ala, ọ makpuru dika ọdum, Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?


Sọl na Jonatan bu ndi nāhurita onwe-ha n'anya, buru kwa ndi di utọ na ndu-ha, Ekewaghi kwa ha n'ọnwu-ha; Ha di garagara kari ugo, Ha di ike kari ọdum.


N'ihi njehie nke ala ha di ọtutu, bú ndi-isi-ya: Ma site na madu nwere nghọta na ihe-ọmuma ka ọnọdu-ya gādigide ogologo mb͕e.


ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida #mbà.


Ma oyiyi iru nile ha, iru madu ka ha nwere; iru ọdum ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-nri; iru ehi ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-ekpe; iru ugo ka ha anọ nwe-kwa-ra.


Ha nwe-kwa-ra aka madu n'okpuru nkù-ha n'akuku anọ ha: ọzọ, iru nile ha na nkù nile ha diri ha anọ otú a;


Ma iru anọ diri cherub ọ bula nime ha: otù iru bu iru cherub ahu, iru nke-abua bu iru madu, nke-atọ bu iru ọdum, nke-anọ bu iru ugo.


Iru anọ iru anọ diri cherub ọ bula, nkù anọ di-kwa-ra cherub ọ bula; oyiyi nke aka madu di kwa n'okpuru nkù-ha.


Nke-mbu di ka ọdum, ọ nwe-kwa-ra nkù abua nke ugo: anọm nēle rue mb͕e ekwopuru nkù-ya abua, ewe si n'ala bulie ya elu, ọ bu kwa n'ukwu abua ka eguzobere ya ọtọ dika madu, ọ bu kwa obi madu ka enyere ya.


Ọ buru na i felie elu dika ugo, ọ buru kwa na ọ bu n'etiti kpakpando ka edoworo akwu-gi, n'ebe ahu ka M'gēme ka i si rida; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Le, ndi ahu nēbili dika nne-ọdum, Dika ọdum ka ọ nēweli onwe-ya: Ọ gaghi-edina rue mb͕e ọ gēri ihe ọ dọb͕utara, Ṅu kwa ọbara nke ndi eb͕uru eb͕u.


Ọ makpuru, o dinara dika ọdum, Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie? Onye ọ bula nke nāgọzi gi bu onye agọziri agọzi, Onye ọ bula nke nābu gi ọnu bu kwa onye anābu ọnu.


Umu-nnam, unu abula umu-ntakiri n'uche-unu: kama burunu umu ọhu n'obi ọjọ, ma n'uche-unu burunu ndi tozuru okè.


Jehova gēsi n'ebe di anya bulie otù mba imegide gi, site na nsọtu uwa, dika ugo si efe; bú mba nke i nānughi asusu-ya;


ihe di kwa n'iru oche-eze ahu dika oké osimiri eji enyo me yiri crystal; ihe anọ nke di ndu nọ kwa n'etiti oche-eze ahu, nọ kwa oche-eze ahu gburugburu, ndi juputara n'anya anya n'iru na azu.


Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-abua, m'we nu ihe nke-abua ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia.


Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-atọ, m'we nu ihe nke-atọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia. M'we hu, ma le, inyinya oji; onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù n'aka-ya.


Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-anọ, m'we nu olu nke ihe nke-anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan