Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 4:10 - Bible Nso

10 orú ndi-okenye na anọ ahu gāda n'ala n'iru Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, ha gākpọ kwa isi ala nye Ya, bú Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, ha gātudà kwa okpu-eze-ha n'iru oche-eze ahu, nāsi,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nʼala nʼihu onye ahụ nọ nʼocheeze na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ha niile nʼotu nʼotu na-atụda okpueze ha nʼihu ya na-abụ abụ na-asị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 4:10
28 Iomraidhean Croise  

Devid we si nkpọkọta ahu nile, Biko, gọzienu Jehova, bú Chineke-unu. Nkpọkọta ahu nile we gọzie Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, ha we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, nye kwa eze.


Umu Israel nile nēlekwasi kwa nrida ọku ahu anya, ya na ebube Jehova nke di n'elu ulo ahu; ha we ruru ala, kpuchie iru-ha n'ala n'elu pavement, kpọ isi ala, we kele Jehova, si, N'ihi na Ọ di nma; n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.


Job we bilie, dọwa uwe-nwuda-ya; kọpu isi-ya, da n'ala, kpọ isi ala;


Ọ bughi ayi, Jehova, ọ bughi ayi, Kama ọ bu aha-Gi ka I gēnye nsọpuru, N'ihi ebere-Gi, na n'ihi ezi-okwu-Gi.


Chineke aghọwo eze mba nile: Chineke anọkwasiwo n'oche-eze nsọ Ya.


E, eze nile gākpọ isi ala nye ya: Mba nile gēfè ya òfùfè.


Batanu, ka ayi kpọ isi ala ruru kwa ala; Ka ayi b͕ue ikperè n'ala n'iru Jehova Onye meworo ayi:


N'arọ nke ọnwu eze, bú Uzaia, m'we hu Onye-nwe-ayi ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze di elu nke ebuliwo-kwa-ra elu, ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-Ya juputa-kwa-ra ulo uku Chineke.


M'we nu onye ahu nke yiri uwe ọcha, onye nọ n'elu miri nke osimiri ahu, o we welie aka-nri-ya na aka-ekpe-ya n'elu-igwe, were Onye ahu Nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi, si, na ọ gādiru otù mb͕e akara àkà, na mb͕e abua akara àkà, na nkera mb͕e akara àkà; ma mb͕e agāb͕ajisi aka nke ndi nsọ ahu, ihe nile ndia gāgwusi.


Ma n'ọgwugwu ubọchi ahu nile mu onwem, bú Nebukadneza, weliri anyam abua lekwasi elu-igwe, ihe-ọmumam we laghachikutem, ọ bu kwa Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka m'gọziri, ọ bu kwa Onye ahu nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi ka m'jara sọpuru kwa, Onye ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, ala-eze-Ya nādigide kwa n'ọb͕ọ nile:


Ha we ba nime ulo, hu Nwatakiri ahu, Ya na Meri nne-Ya; ha we da n'ala kpọ isi ala nye Ya; ha we kpughe ib͕e àkù ha, che onyinye n'iru Ya, ọla-edo na frankincense na myrrh.


Ndi ahu we kpọ isi ala nye Ya, we ji oké ọṅù laghachi na Jerusalem:


Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.


N'ihi na anameweli akam elu nye elu-igwe, We si, Mu onwem nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi,


we were Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, bú Onye kère elu-igwe na ihe nile di ya nime, na uwa na ihe nile di ya nime, na oké osimiri na ihe nile di ya nime, ṅu iyi na oge agaghi-adi kwa ọzọ:


Orú ndi-okenye na anọ ahu, ndi nānọdu n'iru Chineke n'elu oche-eze-ha, we da kpuchie iru ha n'ala, we kpọ isi ala nye Chineke,


Ònye nāgaghi-atu egwu, Onye-nwe-ayi, to kwa aha-Gi? n'ihi na nání Gi di ọcha n'obi; n'ihi na mba nile gābia kpọ kwa isi ala n'iru Gi; n'ihi na emere ka ezi omume-Gi nile puta ìhè.


Otù nime ihe anọ ahu nke di ndu we nye ndi-mọ-ozi asa ahu ọkwa ọla-edo asa juputara n'ọnuma Chineke, Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Orú ndi-okenye na anọ ahu na ihe anọ ahu nke di ndu we da n'ala, kpọ isi ala nye Chineke, bú Onye nānọkwasi n'oche-eze ahu, si, Amen; Haleluya.


Ngwa ngwa emerem ka m'nọ nime Mọ Nsọ: ma le, edebere oche-eze n'elu-igwe, otù Onye nānọkwasi kwa n'oche-eze ahu;


Orú oche-eze na anọ di kwa oche-eze ahu gburugburu: m'we hu orú ndi-okenye na anọ ka ha nānọkwasi n'oche-eze ndia, ndi eb͕okwasiworo uwe ọcha; ahu-kwa-ram okpu-eze nke ọla-edo n'isi-ha.


Mb͕e ọ bula ihe anọ ahu nke di ndu gēnye Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu otuto na nsọpuru na ekele, bú Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi,


Ihe anọ nke di ndu we si, Amen. Ndi-okenye ahu we da n'ala we kpọ isi ala.


Mb͕e Ọ natara akwukwọ ahu, ihe anọ ahu nke di ndu na orú ndi-okenye na anọ ahu we da n'ala n'iru Nwa-aturu ahu, ha nile n'otù n'otù nwere ubọ-akwara, na ọkwa nke eji ọla-edo me nke juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nke bu ekpere ndi nsọ.


Ndi-mọ-ozi nile nēguzo kwa oche-eze ahu na ndi-okenye ahu na ihe anọ ahu nke di ndu gburugburu; ha we da kpuchie iru-ha n'ala n'iru oche-eze ahu, we kpọ isi ala nye Chineke,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan