Ọ gāb͕awa nke-uku, teghari kwa egwú ọṅù, e, n'iteghari-egwú-ọṅù na n'iti-nkpu-ọṅù; nsọpuru Lebanon ka agēnye ya, e, ima-nma nke Kamel na Sheron: ndia gāhu ebube Jehova, bú ima-nma nke Chineke-ayi.
Ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya som; ebe Mu onwem nọ kwa, n'ebe ahu ka onye nējerem ozi gānọ kwa: ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya ka Nnam gāsọpuru.
Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom, nke I nyeworom: n'ihi na I hurum n'anya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa.
Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēme ka ọ buru ide n'ulo nsọ nke Chinekem, ọ gaghi-esi kwa n'ebe ahu pua ọzọ ma-ọli: M'gēde-kwasi kwa ya aha Chinekem, na aha obodo Chinekem, bú Jerusalem ọhu, nke si n'elu-igwe ridata site n'ebe Chinekem nọ, M'gēdekwasi kwa ya aha ọhu nkem.