Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 22:3 - Bible Nso

3 Ọbubu-ọnu ọ bula agaghi-adi ọzọ: oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu gādi kwa nime ya: ndi-orù-Ya gēfè kwa Ya òfùfè:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 A gaghị ahụ ihe ọbụla a bụrụ ọnụ nʼime obodo ahụ. Ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ ga-adị nʼobodo ahụ. Ndị ohu ya ga-efekwa ya ofufe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 22:3
20 Iomraidhean Croise  

I gēme ka m'mara uzọ ndu: Ojuju-afọ ọṅù di n'iru Gi; E! utọ di iche iche di n'aka-nri-Gi ebighi-ebi.


Mu onwem, n'ezi omume ka m'gāhu iru-Gi: Ka afọ jum n'udi gi, mb͕e m'tetara.


Tisie nkpu ike, kpọ nkpu ọṅù, gi nwanyi bi na Zaion n'ihi na onye uku n'etiti gi ka Onye Nsọ nke Israel bu.


Ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ab͕alawo.


Ebe-obibim gādi kwa n'elu ha, M'gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi.


Buruburu-ya gādi orú nnù ami uzọ abua na nnù ise: ma aha obodo ahu site n'ubọ̀chi ahu gābu, Jehova nọ n'ebe ahu.


Agēbi kwa nime ya, nwezuga ka ebibie ya agaghi-adi kwa ọzọ; Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi.


Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi: i kwesiri ka atukwasi gi obi n'umu ihe ole-na-ole, m'gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n'ọṅù nke onye-nwe-gi.


Mb͕e ahu Ọ gāsi kwa ndi nọ n'aka-ekpe-Ya, Puanu n'irum, ndi anābu ọnu, ga n'ọku ebighi-ebi ahu nke edoziworo nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya:


Ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya som; ebe Mu onwem nọ kwa, n'ebe ahu ka onye nējerem ozi gānọ kwa: ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya ka Nnam gāsọpuru.


Chineke gēnye kwa Ya otuto nime Onwe-ya, ngwa ngwa ka Ọ gēnye kwa Ya otuto.


Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M'gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ.


Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom, nke I nyeworom: n'ihi na I hurum n'anya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa.


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēmeghi ka okwu nile nke iwu a guzosie ike, ime ha. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


ha we were oké olu tie nkpu, si, Nzọputa diri Chineke-ayi, Onye nānọkwasi n'oche-eze ahu, di-kwa-ra Nwa-aturu ahu.


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan