Otú a ka Jehova, Nke bu eze Israel na onye-nb͕aputa-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri: Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu; ọ dighi kwa Chineke ọ bula di ma ewezuga nání Mu onwem.
ka ọ nāsi, Ihe i nele anya, de ya n'akwukwọ, ziga-kwa-ra nzukọ Kraist asa ndia; zigara Efesọs, ziga-kwa-ra Smuana, ziga-kwa-ra Pagamọm, ziga-kwa-ra Taiataira, ziga-kwa-ra Sadis, ziga-kwa-ra Filadelfia, ziga-kwa-ra Leọdisia.
Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Smuana akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye ahu nke bu onye mbu na onye ikpe-azu, Onye ghọrọ onye nwuru anwu, we dikwa ndu:
O we sim, Emewo ha. Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, nmalite na ọgwugwu. Mu onwem gēnye onye akpiri nākpọ nku miri site n'isi-iyi miri nke ndu ahu n'efu.
Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Leọdisia akwukwọ, si, Ihe ndia ka Amen ahu nēkwu, bú Onye-àmà ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke bu kwa Onye-ezi-okwu, Isi nke ihe nile Chineke kère: