Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 22:10 - Bible Nso

10 O we sim, Akala okwu nile nke amuma nke akwukwọ a akàrà; n'ihi na oge ahu di nso.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ma ọ sịrị, “Akachila okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ akara, nʼihi na oge adịla nso.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 22:10
21 Iomraidhean Croise  

kwasienu ákwá ike; n'ihi na ubọchi Jehova di nso; dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.


Kechie ihe-àmà, kà iwu akàrà n'etiti ndi-nmutam.


N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme ka ilu a kwusi, ha agaghi-atu kwa ya dika ilu n'Israel ọzọ; kama gwa ha okwu, si, Ha di nso, bú ubọchi ahu, ha na okwu ọhù ọ bula.


Ma gi onwe-gi, Daniel, zobe okwu ndia, kachita kwa akwukwọ a akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: ọtutu madu ganējeghari, ihe-ọmuma gāba kwa uba.


O we si, La, Daniel: n'ihi na ezobewo okwu ndia, kachita kwa ha akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia.


Ma ọhù ahu nke anyasi na ututu nke ekwuworo, ezi-okwu ka ọ bu: ma gi onwe-gi zobe ọhù ahu; n'ihi na ọ diri ọtutu ubọchi di n'iru.


Okwu M'nāgwa unu n'ọchichiri, kwuenu ya n'ìhè: ihe unu nānu kwa na nti, kwusanu ya n'elu ulo.


Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n'ura: n'ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu.


Chi ejimiwo, chi-ọbubọ di kwa nso: ya mere ka ayi yipu ọlu nile nke ọchichiri, ma ka ayi yikwasi ihe-agha nke ihè.


unu ekwela ka onye ọ bula ghọb͕ue unu n'uzọ ọ bula: n'ihi na ọ gaghi-adi, ma ọ buru na nwezuga ahu ebughi uzọ bia, ewe kpughe onye ahu nēmebi iwu, bú nwa nke ila-n'iyì,


Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere:


ka ọ nāsi, Ihe i nele anya, de ya n'akwukwọ, ziga-kwa-ra nzukọ Kraist asa ndia; zigara Efesọs, ziga-kwa-ra Smuana, ziga-kwa-ra Pagamọm, ziga-kwa-ra Taiataira, ziga-kwa-ra Sadis, ziga-kwa-ra Filadelfia, ziga-kwa-ra Leọdisia.


Ngọzi nādiri onye nāgu, na ndi nānu okwu nile nke amuma nka, ndi nēdebe kwa ihe nile edeworo nime ya: n'ihi na oge ahu di nso.


Ma mb͕e éb͕è-elu-igwe asa ahu kwuru okwu, agajem ide akwukwọ: m'we nu olu si n'elu-igwe da, si Kà ihe éb͕è-elu igwe asa ahu kwuru akàrà, ede-kwa-la ha n'akwukwọ.


Mu onwem, bú Jisus, zitere mọ-ozim iwere ihe ndia b͕ara unu àmà nye nzukọm nile. Mu onwem bu nkpọrọgwu Devid, buru kwa nwa ọ muru, kpakpando nēnwu enwu, nke bu kwa kpakpando ututu ahu.


Mu onwem nāb͕ara onye ọ bula àmà, bú onye nānu okwu nile nke amuma nke akwukwọ a, si, Ọ buru na onye ọ bula gātukwasiri ha okwu, Chineke gātukwasiri ya ihe-otiti nile nke edeworo n'akwukwọ a:


Onye ahu Nke nāb͕a àmà ndia nāsi, E: anamabia ọsọsọ. Amen: bia, Onye-nwe-ayi Jisus.


Le kwa, anamabia ọsọsọ. Ngọzi nādiri onye nēdebe okwu nile nke amuma nke akwukwọ a.


O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi, bú ndi-amuma, ha na ndi nēdebe okwu nile nke akwukwọ a: kpọ isi ala nye Chineke.


M'we hu akwukwọ nke edere ya-ri ihe n'ime na azu, nke eji-kwa-rari akàrà asa kasie ya ike, ka ọ di n'aka-nri Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan