Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 21:24 - Bible Nso

24 Mba nile gēwere kwa ìhè-ya jegharia: ndi-eze nke uwa nēwebata kwa ebube-ha nime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Mba niile ga-eji ìhè ya jegharịa. Ndị eze ụwa niile ga-abịakwa webata ebube ha nʼime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 21:24
22 Iomraidhean Croise  

Nsọtu nile nke uwa gēcheta, laghachikute kwa Jehova: Ab͕uru nile nke mba nile gākpọ kwa isi ala n'iru Gi.


O gēru kwa n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ya elu kari ugwu ntà nile; mba nile gērùbà nime ya dika osimiri.


Ulo Jekob, bianu, ka ayi jegharia n'ìhè Jehova.


Ndi-eze gābu kwa nna nāzù umu-gi, ndi-eze-nwanyi-ha gābu kwa ndinyom nēnye umu-gi ara: ha gākpọ isi ala nye gi, kpue iru-ha n'ala, racha ájá ukwu-gi abua; i we mara na Mu onwem bu Jehova, Onye ihere agaghi-eme ndi nēle anyam.


otú a ka ọ gēfesa ọtutu mba ọbara; n'ihi ya ka ndi-eze gēkpuchi ọnu-ha: n'ihi na ihe nke anākọghi nye ha ka ha huworo; ọ bu kwa ihe nke ha nāhughi ka ha ghọtaworo.


N'ihi na dika oké miri-ozuzọ na snow si esi n'elu-igwe ezo, ma ọ bughi n'ebe ahu ka ọ nālaghachi, ma ọ buru na o bughi uzọ desia ala, we me ka o me ihe-omume, ka o pu kwa ihe-opupú; o we were nkpuru nye ọgha-nkpuru, were kwa nri nye onye nēri ihe;


Le, mba nke i nāmaghi ka i gākpọ, mba nke nāmaghi gi gāb͕akute kwa gi, n'ihi Jehova, bú Chineke-gi, ọbuná n'ihi Onye Nsọ nke Israel; n'ihi na O mewo ka i ma nma.


Ebube Lebanon gābiakute gi, osisi fir na osisi pine na osisi cypress n'otù; ime ka ọnọdu ebe nsọm ma nma, M'gēme kwa ka ọnọdu ukwum abua nwe nsọpuru.


I gāṅu kwa miri-ara nke mba di iche iche, ọ bu kwa ara ndi-eze ka i gāmi: i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.


Ma Mu onwem, amaram ọlu nile ha na èchìchè nile ha: mb͕e nābia ijikọta mba nile na asusu nile; ha gābia kwa, hu ebubem.


i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n'ezi-okwu, na n'ikpé ziri ezi, na n'ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi.


Ọtutu mba gārapa-kwa-ra na Jehova n'ubọchi ahu, ghọ-kwa-ram otù ndi: M'gēbi kwa n'etiti gi, i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute gi.


ka m'we buru onye nēfè Kraist Jisus òfùfè ijekuru ndi mba ọzọ, nālu kwa ọlu onye-nchu-àjà nke ozi ọma Chineke, ka ewe me ka iche-ndi-mba-ọzọ-n'iru-Chineke buru ihe agānara nke-ọma, ebe edoro ya nsọ nime Mọ Nsọ.


N'ihi na ọ di Masedọnia na Akaia ezi nma inye ndi-ob͕eye n'etiti ndi nsọ nọ na Jerusalem ihe ufọdu ha gēnwekọ.


Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya ti nkpu ọṅu: N'ihi na Ọ gābọ̀ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya, Ọ́bọ̀ ka Ọ gābọghachi kwa n'aru ndi nēmegide Ya, O gēkpuchi kwa nmehie ala-Ya na ndi-Ya.


ha gēwebata kwa ebube na nsọpuru nke mba nile nime ya:


n'etiti amá-ya. N'akuku a na n'akuku nke-ọzọ nke osimiri ahu ka osisi nke ndu di kwa, nāmi uzọ nkpuru iri na abua, nēnye nkpuru-ya n'ọnwa n'ọnwa: akwukwọ osisi ahu bu ihe ime ka aru di mba nile ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan