Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 21:23 - Bible Nso

23 Anyanwu ma-ọbu ọnwa adighi kwa obodo ahu nkpà, ka ha mukwasi ya: n'ihi na ebube Chineke nyere ya ìhè, oriọna-ya bu kwa Nwa-aturu ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ maọbụ ọnwa mụkwasị ya, nʼihi na ebube nke Chineke bụ ìhè ya, oriọna ya bụkwa Nwa atụrụ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 21:23
25 Iomraidhean Croise  

N'ihi na anyanwu na ọta ka Jehova, bú Chineke, bu: Amara na nsọpuru ka Jehova gēnye: Ọ gaghi-eb͕ochi ezi ihe n'ebe ndi nējeghari n'izu-okè nọ.


Ba n'oké nkume, zobe kwa onwe-gi n'ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke idi-elu-Ya.


Madu gābà kwa n'ọb͕à nile nke oké nkume nile, na n'olùlù nile nke ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku.


ka o we ba n'oghere nile nke oké nkume nile, na nime nb͕awa nile nke nkume nile di elu, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku.


Ọnwa gēnwe kwa iru-ihere, ihere gēme kwa anyanwu; n'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha aghọwo eze n'ugwu Zaion, na nime Jerusalem, ọ bu kwa n'iru ndi-okenye-Ya ka nsọpuru gādi.


Ọzọ, ìhè ọnwa gādi ka ìhè anyanwu, ìhè anyanwu gādi kwa okpukpu asa, dika ìhè ubọchi asa, n'ubọchi Jehova gēkechi nkpaji akpajiri ndi-Ya, mb͕e Ọ gāgwọ kwa ọnyá etiputara n'otiti-ya.


Chineke si na Timan nābia, Onye Nsọ si kwa n'ugwu Peran. Selah Ebube-Ya ekpuchiwo elu-igwe nile, Otuto-Ya juputa-kwa-ra uwa.


N'ihi na Nwa nke madu gaje ibia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi-Ya; mb͕e ahu ka Ọ gēnyeghachi kwa onye ọ bula dika omume-ya si di.


N'ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme n'ọb͕ọ a nke nākwa iko, nke nēmehie kwa, ihere onye ahu gēme kwa Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi mọ-ozi-Ya di nsọ.


Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ, Na ebube ndi-Gi, bú Israel.


Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.


Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula; Chineke, bú Ọkpara amuru nání Ya, Onye nādabere n'obì Nna-Ya, Onye ahu kọrọ Ya nye madu.


Nime Ya ka ndu diri; ndu ahu buru kwa Ìhè nke madu.


Ezi Ìhè ahu diri, Nke nēnye madu ọ bula nke nābia nime uwa ìhè.


Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom, nke I nyeworom: n'ihi na I hurum n'anya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa.


ka madu nile we sopuru Ọkpara ahu, dika ha nāsọpuru Nna-Ya. Onye nādighi-asọpuru Ọkpara adighi-asọpuru Nna Nke zitere Ya.


Mb͕e m'nāhughi uzọ site ebube ìhè ahu, ndi mu na ha nọ we jidem n'aka durum, m'we ba na Damaskọs.


Ndia bu ndi nēmerughi onwe-ha n'aru ndinyom; n'ihi na ha di ọcha ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ndia bu ndi nēso Nwa-aturu ahu ebe ọ bula Ọ nēje. Ndia ka ab͕atara n'etiti madu, iburu Chineke na Nwa-aturu ahu nkpuru mbu.


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi nelu-igwe ridata, nēnwe ike uku; ewe site n'ebube-ya nye uwa ìhè.


nēnwe ebube Chineke: ìhè ọ nēnye yiri nkume dikarisiri oké ọnu-ahia, dika nkume jasper, dika crystal:


Agaghi-emechi kwa ọnu-uzọ-ama-ya n'ehihie ma-ọli (n'ihi na abali agaghi-adi n'ebe ahu):


Abali agaghi-adi kwa ọzọ; ìhè oriọna na ìhè anyanwu adighi kwa ha nkpà; n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke gēnye ha ìhè: ha ganābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


M'we hu Nwa-aturu ka O nēguzo n'etiti oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu, guzo kwa n'etiti ndi-okenye ahu, dika agāsi na eb͕uru Ya-ri, O nwe-kwa-ra mpi asa, na anya asa, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke, bú nke ezigaworo ha n'uwa nile.


n'ihi na Nwa-aturu ahu Nke nọ n'etiti oche-eze ahu gāzù ha dika aturu, Ọ gēduru kwa ha ga n'isi-iyi nke miri nke ndu: Chineke gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan