Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 21:1 - Bible Nso

1 M'we hu elu-igwe ọhu na uwa ọhu: n'ihi na elu-igwe mbu ahu na uwa mbu ahu gabigarari; oké osimiri adighi kwa ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 21:1
13 Iomraidhean Croise  

N'ubọchi ahu Jehova gēwere mma-agha-Ya di arọ́ di uku di ike ji nmehie-ha leta leviathan, bú agwọ nāb͕a ọsọ, na leviathan, bú agwọ b͕agọrọ ab͕agọ; Ọ gēb͕u kwa ogologo anu ahu nke di n'oké osimiri.


Ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ab͕alawo.


Ma ndi nēmebi iwu di ka oké osimiri nke nāmaghari amaghari: n'ihi na ọ pughi idi jū, miri-ya nāmaputa kwa urọ na apiti.


N'ihi na dika elu-igwe ọhu na uwa ọhu, nke Mu onwem nēme, ganēguzo n'irum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), otú a ka nkpuru-unu na aha-unu gēguzo.


Anu anọ nke di uku we nēsi n'oké osimiri rigoputa, ha di iche otù n'ibe-ya.


n'ihi na agēme ka ihe ekère èkè onwe-ya pu kwa n'ibu-orù nmebi ba n'ọnọdu inwe-onwe-ya nke ebube nke umu Chineke.


Ma ubọchi Onye-nwe-ayi gābia dika onye-ori; nke ọ bu nime ya ka elu-igwe gēji oké ùzù gabiga, ihe nile di n'elu-igwe gāb͕a kwa ọku we la n'iyì, uwa na ọlu nile aluru nime ya gērechapu kwa.


Ma dika nkwa-Ya si di, ayi nēle anya elu-igwe ọhu na uwa ọhu, nke ezi omume bi nime ha.


o we guzọ n'ájá oké osimiri. M'we hu anu-ọhia ka ọ nēsi n'oké osimiri rigoputa, nēnwe mpi iri na isi asa, nēkpu kwa okpu-eze iri n'elu mpi-ya, nēnwe kwa aha ufọdu nke nkwulu Chineke n'elu isi-ya.


M'we hu oké oche-eze di ọcha, na Onye nānọkwasi ya, Onye uwa na elu-igwe b͕apuru n'iru Ya; ahughi kwa ebe ọ bula nye ha.


Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu we si, Le, anameme ihe nile ka ha di ọhu. O we si, De akwukwọ: n'ihi na okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu.


Ewe kewapu elu-igwe dika akwukwọ-odide mb͕e anāpiakọta ya; ewe wepu ugwu nile na agwe-etiti nile ọ bula n'ọnọdu-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan