Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 20:9 - Bible Nso

9 Ha we rigo n'obodobo uwa, nọgide ọmuma-ulo-ikwū ndi nsọ gburugburu, ya na obodo ahu nke ahuworo n'anya: ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ha biliri agha guzo nʼụwa niile, gbaa ụlọ ikwu nke ndị nsọ Chineke hụrụ nʼanya gburugburu. Ma ọkụ sitere nʼeluigwe gbadata repịa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 20:9
33 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ;


Onye nējere onye nke Chineke ozi we bilie n'isi-ututu, pua, ma, le, usu-ndi-agha nāb͕a obodo ahu buruburu, ha na inyinya na ub͕ọ-ala. Nwa-okorọbia-ya we si ya, Ewó, onye-nwem! àyi gēme aṅa?


Ì ghọtawo rue obosara uwa? Gosim, ma ọ buru na i nazuwo ya.


Ọku we nēre n'etiti nzukọ-ha; Ire-ọku nērepia ndi nēmebi iwu.


Jehova nāhu ọnu-uzọ-ama nile nke Zaion Kari ebe-obibi nile nke Jekob.


Ọku nāga n'iru Ya, Nēsure kwa ndi-nkpab͕u-Ya buruburu.


N'ihi na edowo otù Tofet n'usoro site na mb͕e gara aga; e, nke ahu ka edoziworo nye eze; O mewo ya ka ọ di omimi, me ya ka ọ sa mbara: obo-ya bu ọku na ọtutu nkú; nku-ume Jehova, dika iyi brimstone, nāfunwu ya.


Mọ-ozi nke Jehova we pua, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ, na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.


i gārigo kwa imegide ndim, bú Israel, dika igwe-oji ikpuchi ala; n'ikpe-azu nke ubọchi ndia ka ọ gēru, na M'gēme ka i biakwasi alam, ka mba nile we maram, mb͕e agēdowomri nsọ nime gi n'anya-ha, gi Gog.


Mu na ya gēkpe kwa ikpe n'ajọ ọria nēfe efe na n'ọbara; ọ bu kwa oké miri-ozuzo nēzobiga ókè, na oké ákú-miri-ígwé, na ọku, na brimstone, ka M'gēme ka ha zokwasi ya, zokwasi kwa usu nile nke ndi-agha-ya, zokwasi kwa ọtutu ndi di iche iche so ya.


I gārigo kwa, dika ikuku siri ike ka i gābia, dika igwe-oji ikpuchi ala ka i gādi, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ọtutu ndi di iche iche so gi.


M'gēziga ọku n'aru Megog na n'aru ndi bi n'agwe-etiti nile na ntukwasi-obi: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Onye-ntipú ahu arigowo n'iru ha: ha etipúwo, we gabiga rue ọnu-uzọ-ama, pua na ya: eze-ha agabigawo kwa n'iru ha, Jehova kwa n'isi ha.


N'ihi na, le, M'gaje ime ka ndi Kaldea bilie, bú mba ahu di ilu nke nēme kwa ngwa ngwa; ndi nējeghari na mbara uwa, inweta ebe-obibi di iche iche nke nābughi nke ha.


Ndi Israel we di ka ndi nātamu ntamu, nēkwu ihe ọjọ na nti Jehova: Jehova we nu ya, iwe-Ya we di ọku; ọku nke Jehova we re n'etiti ha, we ripia madu ufọdu nime nsọtu ọmuma-ulo-ikwū.


Ọku we si n'ebe Jehova nọ puta, ripia ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu nēweta nso ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


ma n'ubọchi Lot siri na Sọdọm puta ọku na brimstone si n'elu-igwe zò, we la ha nile n'iyì:


N'ihi na ubọchi gābiakwasi gi, mb͕e ndi-iro-gi gēgwu ékpè na ìgá imegide gi, nọgide kwa gi gburugburu, jigide kwa gi n'akuku nile,


Ma mb͕e ọ bula unu gāhu Jerusalem ka achi usu-ndi-agha nọgide ya gburugburu, mb͕e ahu maranu na itọb͕ọrọ-n'efu-ya di nso.


Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya, bú Jemes na Jọn, huru nka, ha si, Onye-nwe-ayi, Ì nāchọ ka ayi si ọku site n'elu-igwe da, rechapu ha?


n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nējeghari n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-gi, inaputa gi, na irara ndi-iro-gi nye n'iru gi; ọmuma-ulo-ikwū-gi gādi kwa nsọ: ka O we ghara ihu n'etiti gi ọtọ ihe ọ bula, we laghachi n'iso gi n'azu.


nime ọku nēre ere, nābọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nāmataghi Chineke, ha na ndi nāṅaghi nti ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus:


Ya mere, ka ayi pukuru Ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, nēbu ita-uta-Ya.


Ọ buru kwa na onye ọ bula chọrọ imejọ ha, ọku nēsi n'ọnu-ha puta, nēripia kwa ndi-iro-ha; ọ buru kwa na onye ọ bula gāchọ imejọ ha, aghaghi ib͕u ya otú a.


ọ nēme kwa oké ihe-iriba-ama di iche iche, ka o we me ọbuná ọku ka o si n'elu-igwe ridata n'uwa n'iru madu nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan