Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 2:17 - Bible Nso

17 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēnye ufọdu nime manna ahu nke ezobeworo, M'gēnye kwa ya nkume ọcha, n'elu nkume ahu ka edewo-kwa-ra aha ọhu, nke ọ nādighi onye ọ bula matara ma-ọbughi onye nānata ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Ọ bụ naanị onye na-emeri emeri ka m ga-enye ụfọdụ nʼime achịcha mánà ahụ e zoro ezo. Aga m enyekwa onye ahụ ezi nkume ọcha ahụ, nke edekwasịrị aha ọhụrụ nʼelu ya, nke onye ọbụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ natara ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 2:17
24 Iomraidhean Croise  

Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya; Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe.


Afọ nējubiga ha ókè site n'abuba nke ulo-Gi; Ọ bu kwa miri-iyi nke ihe-utọ-Gi nile ka I nēme ka ha ǹua.


Moses we si Eron, Were otù ite, tiye nju omer nke manna nime ya, dọba ya n'iru Jehova ka ọ buru ihe-ndebe anēdebere ọb͕ọ nile unu.


Obi mara ilu nke aka ya; Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya.


N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu: Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di.


N'ihi na otú a ka Jehova siri ndi-onozi ndi nēdebe ubọchi-izu-ikem nile, ndi rọputawo-kwa-ra ihe tọrọm utọ, ndi nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike:


M'gēnye, ha n'ulom na nime mb͕idim nile ihe-ncheta na aha di nma kari umu-ndikom, kari kwa umu-ndinyom; aha ebighi-ebi ka M'gēnye ha n'otù n'otù, nke anāgaghi-ebipu.


Mba di iche iche gāhu kwa ezi omume-gi, eze nile gāhu nsọpuru-gi: agākpọ kwa gi aha ọhu nke ọnu Jehova gāgu.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji kwue otú a, si, Le, ndi-orùm gēri ihe, ma agu gāgu unu onwe-unu: le, ndi-orùm gāṅu, ihe-ọṅuṅu, ma akpiri gākpọ unu onwe-unu nku: le, ndi-orùm gāṅuri ọṅu, ma ihere gēme unu onwe-unu:


Unu gārapu aha-unu n'azu ighọrọ ndi M'rọputaworo ihe-ọb͕ub͕a-iyi, Onye-nwe-ayi Jehova gēme kwa ka i nwua; ma Ọ gākpọ ndi-orù-Ya aha ọzọ:


O we za, si ha, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu.


Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu.


Ma Ọ siri ha, Mu onwem nwere ihe-oriri iri nke unu onwe-unu nāmataghi.


Ma madu nke nkpuru-obi onwe-ya nāchi adighi-anata ihe nke Mọ nke Chineke: n'ihi na ha bu ihe-nzuzu n'anya-ya; ọ pughi kwa imara ha, n'ihi na ewere Mọ Nsọ sikwuputa ha.


N'ihi na unu nwuru anwu, ezowo kwa ndu-unu n'ebe Kraist-ayi nọ nime Chineke.


ha we nābù dika agāsi na ọ bu abù ọhu n'iru oche-eze ahu, na n'iru ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru imuta abù ahu ma-ọbughi ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ ahu, bú ndi ab͕atarari n'uwa.


O nwe-kwa-ra aha edekwasiworo n'elu uwe-Ya na n'elu apata-ukwu-Ya, EZE kachasi NDI-EZE nile, NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile.


Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, agaghi-emejọ ya site n'ọnwu nke-abua ahu.


Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o rie nkpuru si n'osisi nke ndu ahu puta, bú nke di na Paradais nke Chineke.


Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.


Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan