Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 2:16 - Bible Nso

16 Ya mere, chègharia; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi ọsọsọ, M'gēwere kwa mma-agha nke ọnum bu agha megide ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ya mere, chegharịa! Ma ọ bụghị otu a, aga m abịakwute gị ọsịịsọ jiri mma agha dị m nʼọnụ buso ha agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 2:16
15 Iomraidhean Croise  

kama ọ gēji ezi omume kpe ndi nēnweghi ike ikpe, ọ gēji kwa izi-ezi ba nba bayere ndi di ume-ala n'obi n'uwa: ọ gēji kwa ndele nke ọnu-Ya tib͕ue uwa, ọ gēji kwa iku-ume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua me ka ndi nēmebi iwu nwua.


O we me ka ọnum di ka mma-agha di nkọ, na ǹdò aka-Ya ka O zobeworom; O we me ka m'ghọ àmùmà, n'àkpà-àkú-Ya ka O zebeworom:


Nara-kwa-nu okpu-agha nke bu nzọputa, ya na mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke:


Mb͕e ahu ka agēkpughe kwa onye ahu nēmebi iwu, onye Onye-nwe-ayi Jisus gēwere iku-ume nke si n'ọnu-Ya puta b͕ue, were kwa ngosi nke ọbibia-Ya me ka ọ ghara idi irè;


O nwe-kwa-ra kpakpando asa n'aka-nri-Ya: mma-agha di nkọ nke nwere iru abua nēsi kwa n'ọnu-Ya puta: iru-Ya di kwa ka anyanwu nāmu n'ike-ya.


Ewe were oké okpom-ọku chab͕ue madu: ha we kwulu aha Chineke ahu Onye nwere ike ichi ihe-otiti ndia isi; ha echègharighi kwa inye Ya otuto.


Mma-agha di nkọ nēsi kwa n'ọnu-Ya puta, ka O we were ya tib͕ue mba nile: Ya onwe-ya gēwere kwa nkpa-n'aka nke ígwè zùa ha dika aturu: Ya onwe-ya nāzọ kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke manya nke ọnuma nke iwe Chineke Onye puru ime ihe nile.


ewe were mma-agha nke Onye ahu nānọkwasi n'inyinya ahu, bú mma-agha ahu nke si n'ọnu-Ya puta, b͕ue ndi fọduru: nnunu nile we rijuru afọ site n'anu-aru-ha.


Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Pagamọm akwukwọ, si, Ihe ndi ka O nēkwu, bú Onye ahu Nke nwere mma-agha di nkọ ahu nke nwere iru abua:


Ya mere cheta ebe i siworo dapu, gi chèghari kwa, lu kwa ọlu mbu; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi, M'gēwepu kwa ihe-idọba-oriọna-gi n'ọnọdu-ya, ma asi na i chègharighi.


Onye ahu Nke nāb͕a àmà ndia nāsi, E: anamabia ọsọsọ. Amen: bia, Onye-nwe-ayi Jisus.


Le kwa, anamabia ọsọsọ. Ngọzi nādiri onye nēdebe okwu nile nke amuma nke akwukwọ a.


Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n'anya, anamatu ha nmehie ha n'anya, zí kwa ha ihe site n'inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n'obi, chèghari kwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan