Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 19:19 - Bible Nso

19 M'we hu anu-ọhia ahu, na ndi-eze uwa, na usu nile nke ndi-agha-ha, ka ha zukọrọri ibu agha megide Onye ahu Nke nānọkwasi inyinya ahu, megide kwa usu-ndi-agha-Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Mgbe ahụ, ahụrụ m anụ ọhịa ọjọọ ahụ ya na ndị eze niile dị nʼụwa, na ndị agha ha, ka ha zukọtara ibu agha megide onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ahụ na ndị agha ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 19:19
14 Iomraidhean Croise  

Ọ gēsite kwa n'ezi uche-ya me ka aghughọ ga nke-ọma n'aka-ya; ọ bu kwa n'obi-ya ka ọ gēme onwe-ya uku; ọ bu kwa na mb͕e udo-ha ka ọ gēbibi ọtutu madu: ọ bu kwa imegide onye-isi nke ndi-isi ka ọ gēguzo; ma agāb͕aji ya nējighi aka.


Ma mb͕e ọ bula ha gāb͕azuwo àmà-ha, anu-ọhia ahu nke nēsi n'abyss ahu rigoputa gēbu agha megide ha, meri kwa ha, b͕u kwa ha.


Mọ-ozi ọzọ, bú nke-atọ, we so ha, were oké olu si, Ọ buru na onye ọ bula nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, nānata kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ya, ma-ọbu n'aka-ya,


n'ihi na ha bu mọ nke ndi-mọ ọjọ, nēme ihe-iriba-ama di iche iche; ndi nāpukuru ndi-eze nke elu-uwa dum madu bi, ime ka ha zukọ ibu agha nke oké ubọchi ahu nke Chineke, Onye puru ime ihe nile.


Ha we me ka ha zukọ n'ebe ahu nke anākpọ n'asusu Hibru Amagedọn.


Ndi-eze uwa, ndi soro ya kwa iko nupu kwa isi, ha gākwa-kwa-ra ya ákwá, ti-kwa-ra ya aka n'obi, mb͕e ha gēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya,


ewe were mma-agha nke Onye ahu nānọkwasi n'inyinya ahu, bú mma-agha ahu nke si n'ọnu-Ya puta, b͕ue ndi fọduru: nnunu nile we rijuru afọ site n'anu-aru-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan