Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 18:9 - Bible Nso

9 Ndi-eze uwa, ndi soro ya kwa iko nupu kwa isi, ha gākwa-kwa-ra ya ákwá, ti-kwa-ra ya aka n'obi, mb͕e ha gēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 18:9
24 Iomraidhean Croise  

ọ le anya n'ebe Sọdọm na Gọmọra di, na n'ebe ala nile nke Buruburu-ala ahu di, ọ we hu, ma, le, anwuru-ọku nke ala ahu rigoro dika anwuru-ọku nke oké ọku.


Onye ezi omume gāṅuri mb͕e ọ huru ọ́bọ̀ ahu: Ọ gāsa nzọ-ukwu-ya nile n'ọbara onye nēmebi iwu.


Babilon, bú ihe mara nma nke ala-eze nile, ima-nma nke npako ndi Kaldea, ọ gādi ka mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.


N'ihi na edowo otù Tofet n'usoro site na mb͕e gara aga; e, nke ahu ka edoziworo nye eze; O mewo ya ka ọ di omimi, me ya ka ọ sa mbara: obo-ya bu ọku na ọtutu nkú; nku-ume Jehova, dika iyi brimstone, nāfunwu ya.


Dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); otú a ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.


Site n'olu nke owuwe Babilon uwa mara jijiji, anuwo kwa iti-nkpu n'etiti mba nile.


Na mberede ka Babilon daworo, ewe tipia ya: kwasierenu ya ákwá ike; werenu balm bayere ihe-nb͕u-ya ma eleghi anya agāgwọta ya.


I juwo ndi nile bi n'agwe-etiti nile anya, ndi-eze-ha atuwo ujọ nke-uku, iru-ha ab͕arusiwo.


Ọ nākpọsi nkpu ike, ọ bu kwa otú a ka ọ nāsi, B͕utuenu osisi ahu, b͕ukapusia alaka-ya nile, rurupu akwukwọ-ya nile, kpasa nkpuru-ya: ka anu-ọhia si n'okpuru ya b͕apu, ka nnunu nile si kwa n'alaka-ya fepu.


mb͕e ha nāhu kwa na ala-ya nile bu brimstone, na nnú, na orire-ọku, na adighi-agha ya nkpuru, na ọ dighi-eme kwa ka ihe pue, na ọ dighi kwa ihe-ọkukú ọ bula nētolite nime ya, dika nkwatu Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, nke Jehova kwaturu n'iwe-Ya na n'ọnuma-Ya:


Ma ju umu-ab͕ọghọ di-ha nwuru: n'ihi na mb͕e ọ bula ha nupuru isi n'okpuru Kraist-ayi, ha nāchọ ilu di;


anwuru-ọku nke nmekpa-aru-ha nārigo rue mb͕e nile ebighi-ebi; ha adighi-ezu kwa ike ehihie na abali, bú ndi nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, ma ọ buru kwa na onye ọ bula anata akàrà nke aha-ya.


onye ya na ndi-eze uwa kwara iko, eme-kwa-ra ka manya ikwa-iko-ya bà ndi bi n'uwa n'anya.


ti kwa nkpu mb͕e ha nēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya, si Òbodo gini yiri obodo uku a?


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


N'ihi na mba nile adawo site na manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya; ndi-eze uwa so-kwa-ra ya kwa iko, ndi-ahia nke uwa buru ọgaranya site n'ike nke inupu-isi-ya.


Ka ha ra, bú otuto o nyere onwe-ya, na inupu-isi ọ nupuru, nyenu ya nmekpa-aru na iru-újú ra otú ahu: n'ihi na ọ nāsi n'obi-ya, Anamanọdu dika eze-nwanyi, abughikwa m nwanyi di-ya nwuru, ọ dighi kwa iru-újú m'gāhu ma-ọli.


Nke mere ya abua ha we si, Haleluya. Anwuru-ọku-ya nārigo elu rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Le, anamatubà ya n'ihe-nkpab͕u, tubà kwa ndi soro ya kwa iko nime oké nkpab͕u, ma asi na ha echègharighi n'ọlu-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan