Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 18:6 - Bible Nso

6 Nyeghachinu ya ọbuná dika ya onye-ya nyeghachiri madu, nye-kwa-nu ya okpukpu abua dika ọlu-ya nile di: nime iko ahu ọ kwara akwa, kwaranu ya okpukpu abua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu. Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere. Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 18:6
21 Iomraidhean Croise  

Gi ada Babilon, nke bu onye anāpunara ihe; Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye gākwughachi gi Nmeso-gi nke i mesoworo ayi.


Nye ha dika ọlu-ha si di, na dika ijọ-njọ nke nmeso nile ha si di: Nye ha dika aka-ha si eme; Nyeghachi ha ihe ha mere.


Gwanu Jerusalem okwu gābà ya n'obi, kpọ-kwa-nu ya òkù, si, na obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n'aka Jehova okpukpu abua n'ihi nmehie-ya nile.


N'ọnọdu ihere-unu unu gēnwe okpukpu: n'ọnọdu-ihere ha gēti nkpu ọṅù n'òkè-ha: n'ihi ya n'ala-ha okpukpu ka ha gēnweta: ọṅù ebighi-ebi gādiri ha.


Ma M'gēburu uzọ kwughachi ajọ omume-ha na nmehie-ha okpukpu abua; n'ihi na ha emewo alam ka ọ ghara idi nsọ n'ozu nke nile ha nke nāsọ oyi, ọ bu kwa ihe-árú nile ha ka ha ji kpojue ihe-nketam.


Ka ihere me ndi nēsob͕um, ma ka ihere ghara ime mu onwem; ka ndi ahu tua ujọ, ma ka mu onwem ghara itu ujọ: me ka ubọchi ihe ọjọ biakwasi ha, were kwa okpukpu ntipia abua tipia ha.


Kpọnu nkpu-agha megide ya buruburu; o kweyewo ekweye; ihe-nkwagide-ya nile adawo, etikpọwo kwa mb͕idi-ya nile: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu: bọ̀nu ya ọ́bọ̀; dika ọ meworo, menu ya otú a.


Menu ka ndi-ọb͕a-uta nuru izukọ imegide Babilon, bú ndi nile nāzọ uta ukwu ikwe ya; manu ulo-ikwū-unu imegide ya buruburu; ya ghara inwe ndi b͕apuru ab͕apu: kwughachinu ya ugwọ dika ọlu-ya si di; dika ihe nile si di nke o meworo, menu ya otú a: n'ihi na Jehova ka o meworo nganga megide, megide Onye Nsọ nke Israel.


M'gākwughachi kwa Babilon, kwughachi kwa ndi nile bi na Kaldea, ihe ọjọ nile ha nke ha meworo nime Zaion n'anya-unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ọbuná Babilon aghaghi ida, unu ndi eb͕uru eb͕u nke Israel, ọ bu kwa na Babilon ka ndi ala ahu nile eb͕uru eb͕u gāda.


I gēnyeghachi ha nmeso-ha, Jehova, dika ọlu aka-ha si di.


Laghachinu n'ebe ewusiri ike, unu ndi-nkpọrọ nke olile-anya ahu: ọbuná ta ka M'nēgosi na ọ bu okpukpu abua ka M'gēnyeghachi gi.


Aleksanda onye nākpu ọlà merem ọtutu ihe ọjọ: Onye-nwe-ayi gēnyeghachi ya ihe dika ọlu-ya nile si di:


Ọ buru na ọ diri onye ọ bula ka adọta ya n'agha, ọ bu n'agha ka agādọta ya: ọ buru na onye ọ bula gēji mma-agha b͕u madu, aghaghi iji mma-agha b͕u ya. Nebe a ka ntachi-obi na okwukwe nke ndi nsọ di.


ya onwe-ya gāṅu kwa nime manya nke ọnuma Chineke, nke edoziworo nāgwaghi-agwa nime iko nke iwe-Ya; agēji kwa ọku na brimstone mekpa ya aru n'iru ndi-mọ-ozi di nsọ, na n'iru Nwa-aturu ahu:


Ewe kewa obodo uku ahu uzọ atọ, obodo nile nke mba nile we da: ewe cheta Babilon uku ahu n'iru Chineke, inye ya iko nke manya nke ọnuma nke iwe-Ya.


onye ya na ndi-eze uwa kwara iko, eme-kwa-ra ka manya ikwa-iko-ya bà ndi bi n'uwa n'anya.


Eb͕okwasiwo kwa nwanyi ahu ákwà ododo na ákwà uhie, ewerewo kwa ọla-edo na nkume di oké ọnu na pearl chọ ya nma, o nwe-kwa-ra ìko ọla-edo n'aka-ya nke juputara n'ihe-árú, bú ihe nile nādighi ọcha nke ikwa-iko-ya,


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan