Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 18:4 - Bible Nso

4 M'we nu olu ọzọ ka o nēsi n'elu-igwe dà, si, Ndi nkem, sinu nime ya puta, ka unu we ghara iso ya nwekọ nmehie-ya nile, ghara kwa inata ufọdu nime ihe-otiti-ya nile:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị, “ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ ka unu ghara iketa oke na mmehie ya, ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 18:4
16 Iomraidhean Croise  

Lot we pua, gwa di umu-ya, ndi nālu umu-ya ndinyom, okwu, si, Bilienu, si n'ebe a pua; n'ihi na Jehova nēbibi obodo a. Ma ọ di ka onye nākwa emò n'anya di umu-ya.


Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ, Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.


Sinu na Babilon pua, b͕anarinu ndi Kaldea; werenu olu nke iti-nkpu-ọṅù gosi, me ka anuru nka, menu ka ọ puta ìhè rue nsọtu uwa: sinu, Jehova ab͕aputawo orù-Ya, bú Jekob.


Wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, sinu n'ebe ahu pua, unu emetula ihe ruru árú: sinu n'etiti ya pua: dinu ọcha, unu ndi nēbu ihe di iche iche nke Jehova.


Sinu n'etiti Babilon wagharia, si-kwa-nu n'ala ndi Kaldea pua, di-kwa-nu ka nkpi n'iru ìgwè ewu na aturu.


Sinu n'etiti ya pua, unu ndim, wepuganu onwe-unu n'otù n'otù n'iwe di ọku nke Jehova.


Unu ndi b͕apuworo na mma-agha, jenu, unu eguzola; chetanu Jehova site n'ebe di anya, ka Jerusalem bata kwa n'obi-unu.


Sinu n'etiti Babilon b͕alaga, wepuga-kwa-nu onwe-unu n'otù n'otù; unu ekwela ka eme unu ka unu dere du n'ajọ omume-ya: n'ihi na mb͕e ibọ̀-ọ́bọ̀ ka ọ buru Jehova; nmeso obodo ahu ka Ya onwe-ya nākwughachi ya.


Ayi gāgwọtawori Babilon, ma agwọtaghi ya: rapunu ya, ka ayi la, onye ọ bula n'ala-ya: n'ihi na ikpé-ya erutuwo elu-igwe, ebuliwo kwa ya rue mbara-ígwé.


unu nāsi kwa, Ọ buru na ayi nọri n'ubọchi nna-ayi-hà, ayi agaghi-eso ha n'inwekọ ọbara ndi-amuma.


N'ihi nka Sinu n'etiti ha puta, guzo-kwa-nu iche, ka Onye-nwe-ayi kwuru, Unu emetu-kwa-la ihe nādighi ọcha aka; Mu onwem gākpọbata kwa unu,


Ebikwasila onye ọ bula aka n'isi ọsọsọ, eso-kwa-la ndi ọzọ nwekọ nmehie-ha: debe onwe-gi ọcha.


n'ihi na onye nāsi ya biri nke-ọma nēso ya n'inwekọ ọlu-ya nile, nke bu ajọ ọlu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan