Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 18:3 - Bible Nso

3 N'ihi na mba nile adawo site na manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya; ndi-eze uwa so-kwa-ra ya kwa iko, ndi-ahia nke uwa buru ọgaranya site n'ike nke inupu-isi-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nʼihi na mba niile aṅụọla site na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya. Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko, ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 18:3
17 Iomraidhean Croise  

Otú a ka ha diri gi, bú ihe nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu nime ha: ndi gi na ha nāzu ahia site na mb͕e i di na nwata awaghariwo, onye ọ bula rue ofè nke ya; ọ dighi onye nāzọputa gi.


Nebukadreza, bú eze Babilon, eripiawom, o kpochapuwom, o mewom ka m'ghọ aria nke ihe nādighi, o lowom dika ogologo anu-miri, o mejuwo afọ-ya n'ihe-utọm nile, ọ chupuwom.


Iko ọla-edo ka Babilon buworo n'aka Jehova, nke nēme ka uwa nile ṅubiga manya ókè: ufọdu nime manya-vine-ya ka mba di iche iche ṅuworo; n'ihi nka ka mba di iche iche nāwi ara.


Ndi nēri nání ihe utọ di iche iche tọb͕ọrọ n'efu n'èzí nile: Ndi azùputaworo n'uwe uhie amakuwo ebe-ikpofu-ahihia.


n'ihi iba-uba nke ikwa-iko nile nke nwanyi nākwa iko onye mara nma nke-uku, bú nwanyi nwe mb͕asi di iche iche, nke nēre mba di iche iche site n'ikwa-iko-ya nile, na ab͕uru di iche iche site na mb͕asi-ya nile.


Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? nwòke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi ezi uwe kachasi mma, ndi bi kwa n'oké oriri na oké ọṅuṅu, nọ n'ulo ndi-eze.


Ma ju umu-ab͕ọghọ di-ha nwuru: n'ihi na mb͕e ọ bula ha nupuru isi n'okpuru Kraist-ayi, ha nāchọ ilu di;


Mọ-ozi ọzọ, bú nke-abua, we so, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, nke meworo ka mba nile ṅua nime manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya.


onye ya na ndi-eze uwa kwara iko, eme-kwa-ra ka manya ikwa-iko-ya bà ndi bi n'uwa n'anya.


Ha we kpokwasi ájá n'isi-ha, ti kwa nkpu, nākwa ákwá, nēru kwa újú, si, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke ndi nile ndi nwere ub͕ọ-ha n'oké osimiri buru ọgaranya nime ya site n'ibi-obi-ya di oké ọnu-ahia! n'ihi na n'otù oge hour ka emere ka ọ tọb͕ọ n'efu.


ìhè nke oriọna agaghi-enwu kwa nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke onye nālu nwunye ọhu na nke nwanyi anālu ọhu nime gi ọzọ ma-ọli: n'ihi na ndi-ahia-gi buri ndi-amadi nke uwa; n'ihi na ewere igwọ-nsi-gi duhie mba nile.


Ka ha ra, bú otuto o nyere onwe-ya, na inupu-isi ọ nupuru, nyenu ya nmekpa-aru na iru-újú ra otú ahu: n'ihi na ọ nāsi n'obi-ya, Anamanọdu dika eze-nwanyi, abughikwa m nwanyi di-ya nwuru, ọ dighi kwa iru-újú m'gāhu ma-ọli.


Ndi-eze uwa, ndi soro ya kwa iko nupu kwa isi, ha gākwa-kwa-ra ya ákwá, ti-kwa-ra ya aka n'obi, mb͕e ha gēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan