Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 18:23 - Bible Nso

23 ìhè nke oriọna agaghi-enwu kwa nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke onye nālu nwunye ọhu na nke nwanyi anālu ọhu nime gi ọzọ ma-ọli: n'ihi na ndi-ahia-gi buri ndi-amadi nke uwa; n'ihi na ewere igwọ-nsi-gi duhie mba nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ìhè nke sitere nʼoriọna agaghị acha nʼime gị ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwunye agaghị adịkwa. Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa, ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 18:23
26 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Jehoram huru Jihu, na ọ siri, Ùdo di kwa, Jihu? Ọ si, Gini bu udo ahu, na mb͕e ikwa-iko Jezebel, bú nne-gi, na mb͕asi-ya nādi ọtutu?


Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu? Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha? Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya?


N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ; Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.


Ònye zubeworo nka megide Taia, bú obodo nke nēkpube ndi ọzọ okpu-eze, nke ndi-ahia-ya bu ndi-isi, nke ndi-ọzu-ahia-ya bu ndi-nsọpuru nke uwa?


ma ihe abua ndia gābiakute gi n'otù ntabi-anya n'otù ubọchi, bú ọb͕ub͕a-aka-umu na ọnọdu nwanyi di-ya nwuru: dika izu-okè-ha si di ka ha biakwasiworo gi, n'ọtutu mb͕asi-gi, na n'inwebiga-ume-ókè nke ọlu dibia-nrafu nile i nālu.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje ime ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nwoke nālu nwunye ọhu na olu nwanyi anālu ọhu kwusi n'ebe a n'anya-unu na n'ubọchi-unu.


Ọzọ, M'gēme ka olu obi-utọ, na olu ọṅù, na nwoke nālu nwunye ọhu, na olu nwanyi anālu ọhu, na olu nkume-igwe-nri, na ìhè oriọna, lanari ha n'iyì.


M'gēme kwa ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu kwusi n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: n'ihi na nkpọnkpọ ebe ka ala nka gāghọ.


n'ihi iba-uba nke ikwa-iko nile nke nwanyi nākwa iko onye mara nma nke-uku, bú nwanyi nwe mb͕asi di iche iche, nke nēre mba di iche iche site n'ikwa-iko-ya nile, na ab͕uru di iche iche site na mb͕asi-ya nile.


Ha we nāṅa ya nti, n'ihi na o wereri mb͕asi-ya nile me ka ibobo nwua ha n'aru n'oge di anya.


Ewe chudà dragon uku ahu, bú agwọ ochie ahu, onye anākpọ Ekwensu na Setan, onye nēduhie uwa nile madu bi; achudara ya n'uwa, chudà kwa ndi-mọ-ozi-ya, ha na ya.


onye ya na ndi-eze uwa kwara iko, eme-kwa-ra ka manya ikwa-iko-ya bà ndi bi n'uwa n'anya.


edekwasi-kwa-rari aha n'egedege-iru-ya, bú IHE-OMIMI, BABILON UKU AHU, NNE NKE NDI NÁKWA IKO NA NKE IHE-ÁRÚ NILE NKE UWA.


Agaghi-anu kwa olu ndi nākpọ ubọ-akwara na ndi nākpọ ubọ ọzọ na ndi nēb͕u ọ̀jà na ndi nāfù opì nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-ahu kwa onye-ọ̀kà ọ bula, nke nēme ǹkà ọ bula, nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke nkume-igwe-nri nime gi ọzọ ma-ọli;


N'ihi na mba nile adawo site na manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya; ndi-eze uwa so-kwa-ra ya kwa iko, ndi-ahia nke uwa buru ọgaranya site n'ike nke inupu-isi-ya.


Ndi-eze uwa, ndi soro ya kwa iko nupu kwa isi, ha gākwa-kwa-ra ya ákwá, ti-kwa-ra ya aka n'obi, mb͕e ha gēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya,


Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.


N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya.


Abali agaghi-adi kwa ọzọ; ìhè oriọna na ìhè anyanwu adighi kwa ha nkpà; n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke gēnye ha ìhè: ha ganābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Ndi-eze nke uwa, na ndi-amadi, na ndi-isi-ọchi-agha, na ndi-ọgaranya, na ndi di ike, na orù ọ bula, na onye ọ bula nwere onwe-ya, we zobe onwe-ha nime ọb͕à na nime oké nkume nke ugwu:


ha echègharighi kwa isi n'ib͕u-madu-ha, ma-ọbu n'igwọ-nsi-ha, ma-ọbu n'ikwa-iko-ha, ma-ọbu n'izu-ori-ha, puta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan