Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 18:21 - Bible Nso

21 Otù mọ-ozi nke di ike we būru nkume, dika oké nkume-igwe-nri, we tubà ya nime oké osimiri, si, Otú a ka agātuda Babilon, bú obodo uku ahu, n'oké ọdida, agaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi dị ukwuu tụtụlitere otu nkume nke dịka nkume igwe nri, tụba ya nʼime oke osimiri, na-asị, “Otu a ka a ga-esi tufuo Babilọn obodo ukwu ahụ, agaghị ahụkwa ya ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 18:21
14 Iomraidhean Croise  

I kewa-kwa-ra oké osimiri n'iru ha, ha we gabiga n'etiti oké osimiri n'elu ala-akọrọ; ma I tubàra ndi nāchu ha na miri di omimi, dika nkume nime miri di ike.


Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya: Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.


O we gabiga, ma, le, ọ nọgh: M'we chọ ya, ma achọtaghi ya.


Ob͕u-miri nēkpuchi ha: Ha aridawo na miri di omìmì dika nkume.


ihe-ima-jijiji ka m'gēme gi ka i buru, i gaghi-adi kwa ọzọ: agāchọ kwa gi, ma agaghi-achọta kwa gi ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ọ gēchighari kwa iru-ya le ebe nile siri ike nke ala nke aka ya: ma ọ gāsu ngọngọ da, agaghi-ahu kwa ya.


M'we hu mọ-ozi ọzọ di ike, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, nke eb͕okwasiworo ya igwe-oji dika uwe; eke-na-ogwurugwu ahu di kwa n'isi-ya, iru-ya di kwa ka anyanwu, ukwu-ya abua di kwa ka ide ọku;


ha enweghi kwa ike, ahughi kwa ọnọdu-ha ọzọ n'elu-igwe.


Agwe-etiti nile ọ bula we b͕alaga, ahughi kwa ugwu nile ọzọ.


ka ha nēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, Babilon, bú obodo ahu di ike! n'ihi na n'otù oge hour ka ikpé-gi biara.


Agaghi-anu kwa olu ndi nākpọ ubọ-akwara na ndi nākpọ ubọ ọzọ na ndi nēb͕u ọ̀jà na ndi nāfù opì nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-ahu kwa onye-ọ̀kà ọ bula, nke nēme ǹkà ọ bula, nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke nkume-igwe-nri nime gi ọzọ ma-ọli;


M'we hu oké oche-eze di ọcha, na Onye nānọkwasi ya, Onye uwa na elu-igwe b͕apuru n'iru Ya; ahughi kwa ebe ọ bula nye ha.


M'we hu mọ-ozi di ike, ka o nēwere oké olu nēkwusa, si, Ònye kwesiri isaghe akwukwọ ahu, na inyawapu akàrà-ya?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan