Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 18:19 - Bible Nso

19 Ha we kpokwasi ájá n'isi-ha, ti kwa nkpu, nākwa ákwá, nēru kwa újú, si, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke ndi nile ndi nwere ub͕ọ-ha n'oké osimiri buru ọgaranya nime ya site n'ibi-obi-ya di oké ọnu-ahia! n'ihi na n'otù oge hour ka emere ka ọ tọb͕ọ n'efu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ha ga-ekpokwasị aja nʼisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị, “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu a maara aha ya ebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri ghọrọ ndị ọgaranya site nʼakụ dị nʼime ya. Ma ugbu a, nʼotu ntabi anya, ihe niile dị nʼime ya bụ ihe a laara nʼiyi.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 18:19
13 Iomraidhean Croise  

Tema we būru ntu n'isi-ya dọwa uwe-nwuda nwere aka nke di n'aru ya; ọ tukwasi aka-ya n'isi-ya, we la, nēje nēti nkpu.


Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nka achikọtara umu Israel n'obubu-ọnu, na n'ákwà-nke, ájá dikwasi kwa ha.


Ha we welie anya-ha site n'ebe di anya, le ya, ma ha amataghi ya, ha we welie olu-ha, kwa ákwá. ha we dọwa, nwoke ọ bula uwe-nwuda-ya, ha we kpokwasi ájá n'isi-ha n'ikpoli ya n'ebe elu-igwe di.


Babilon, bú ihe mara nma nke ala-eze nile, ima-nma nke npako ndi Kaldea, ọ gādi ka mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.


Ndi-okenye nke ada Zaion nānọdu ala, dere du; Ha ekpokwasiwo ájá n'isi-ha; ha ekewo ákwà-nkpe n'úkwù-ha: Umu-ab͕oghọ Jerusalem ndi nāmaghi nwoke erulatawo isi-ha n'ala.


me ka anuru olu-ha n'elu gi, tie nkpu ilu, kpokwasi ájá n'isi-ha, na ntu ka ha gāturu onwe-ha:


Joshua we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, da kpue iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova rue anyasi, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel; ha we kpokwasi ájá n'isi-ha.


Mpi iri ahu i huru, ha na anu-ọhia ahu, ndia gākpọ nwanyi ahu nākwa iko asì, ha gēme kwa ya ka ọ buru onye tọb͕ọrọ n'efu buru kwa onye b͕a ọtọ, ha gēri kwa anu-aru-ya, rechapu kwa ya n'ọku.


ka ha nēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, Babilon, bú obodo ahu di ike! n'ihi na n'otù oge hour ka ikpé-gi biara.


N'ihi na mba nile adawo site na manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya; ndi-eze uwa so-kwa-ra ya kwa iko, ndi-ahia nke uwa buru ọgaranya site n'ike nke inupu-isi-ya.


N'ihi nka ọ bu n'otù ubọchi ka ihe-otiti-ya nile gābia, bú ọnwu, na iru-újú, na unwu; agērechapu kwa ya n'ọku; n'ihi na Ọ di ike, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye kpere ya ikpé.


Otù nwoke onye Benjamin we si n'usoro agha ahu b͕a ọsọ, biarue Shailo n'ubọchi ahu, uwe nwuda ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi ya n'isi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan