Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 18:10 - Bible Nso

10 ka ha nēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, Babilon, bú obodo ahu di ike! n'ihi na n'otù oge hour ka ikpé-gi biara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị, “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha ya gị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara. Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 18:10
17 Iomraidhean Croise  

ma, le, ub͕u a ka usu madu nābia, ndi-inyinya nēje abua abua. O we za, si, Ọ dawo, Babilon adawo; ọzọ, arusi nile apiri api nke chi-ya nile ka etipiaruworo ala.


ma ihe abua ndia gābiakute gi n'otù ntabi-anya n'otù ubọchi, bú ọb͕ub͕a-aka-umu na ọnọdu nwanyi di-ya nwuru: dika izu-okè-ha si di ka ha biakwasiworo gi, n'ọtutu mb͕asi-gi, na n'inwebiga-ume-ókè nke ọlu dibia-nrafu nile i nālu.


Éwù! n'ihi na ub͕ochi ahu di uku, ọ dighi kwa ubọchi nke di ka ya: ọbuná mb͕e ahuhu ka ọ buru Jekob; ma agēsi nime ya zọputa ya.


M'gākpasu kwa obi nke ọtutu ndi di iche iche, mb͕e M'gēme ka ntipia-gi bia n'etiti mba nile, rue ala di iche iche nke i nāmaghi.


Ewó, ubọchi ahu! n'ihi na ubọchi Jehova di nso, dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.


N'ihi nka ka Jehova bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye-nwe-ayi, jiri si otú a: N'amá nile ka otiti-aka-n'obi gādi; ọ bu kwa n'èzí nile ka ha gāsi, Éwù! éwù! ha gākpọ kwa onye-ubi ibia iru-újú, kpọsa-kwa-ra ndi mara igu awa otiti-aka-n'obi.


Israel nile ndi nọ ha buruburu we b͕alaga n'olu ákwá-ha: n'ihi na ha siri, Ka ala we ghara iloda ayi.


Ozu-ha we di n'amá nke obodo uku ahu, bú nke anākpọ Sọdọm na Ijipt n'uzọ nke Mọ Nsọ, ebe akpọgide-kwa-ra Onye-nwe-ha n'obe.


Mọ-ozi ọzọ, bú nke-abua, we so, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, nke meworo ka mba nile ṅua nime manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya.


Ewe kewa obodo uku ahu uzọ atọ, obodo nile nke mba nile we da: ewe cheta Babilon uku ahu n'iru Chineke, inye ya iko nke manya nke ọnuma nke iwe-Ya.


Mpi iri ahu nke i hu-kwa-ra bu eze iri, madu ndi akānataghi ala-eze ọ bula; ma ha nānata ike dika ndi-eze, ha na anu-ọhia ahu, otù oge hour.


ti kwa nkpu mb͕e ha nēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya, si Òbodo gini yiri obodo uku a?


Ha we kpokwasi ájá n'isi-ha, ti kwa nkpu, nākwa ákwá, nēru kwa újú, si, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke ndi nile ndi nwere ub͕ọ-ha n'oké osimiri buru ọgaranya nime ya site n'ibi-obi-ya di oké ọnu-ahia! n'ihi na n'otù oge hour ka emere ka ọ tọb͕ọ n'efu.


Otù mọ-ozi nke di ike we būru nkume, dika oké nkume-igwe-nri, we tubà ya nime oké osimiri, si, Otú a ka agātuda Babilon, bú obodo uku ahu, n'oké ọdida, agaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli.


N'ihi nka ọ bu n'otù ubọchi ka ihe-otiti-ya nile gābia, bú ọnwu, na iru-újú, na unwu; agērechapu kwa ya n'ọku; n'ihi na Ọ di ike, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye kpere ya ikpé.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan