Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 17:18 - Bible Nso

18 Ma nwanyi ahu i huru bu obodo uku ahu, nke nwere ala-eze nāchi ndi-eze uwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ma nwanyị a ị hụrụ bụ obodo ukwu ahụ na-achị ndị eze niile nke ụwa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 17:18
7 Iomraidhean Croise  

Otú a ka ọ siri, Anu nke-anọ gābu ala-eze nke-anọ n'uwa, nke gāpu iche n'ala-eze nile, ọ gēripia kwa uwa nka nile, zọpia ya, tapia ya.


Ma o rue na mb͕e ahu, iwu si n'ebe Sisa Ọgọstọs nọ puta na agēde aha madu nile bi n'elu-uwa dum madu bi n'akwukwo.


Ozu-ha we di n'amá nke obodo uku ahu, bú nke anākpọ Sọdọm na Ijipt n'uzọ nke Mọ Nsọ, ebe akpọgide-kwa-ra Onye-nwe-ha n'obe.


Ọdudù-ya nādọrọ kwa otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nke elu-igwe, o we tudà ha n'ala: dragon ahu we guzo n'iru nwanyi ahu onye gaje imuputa nwa, ka o we ripia Nwa-ya mb͕e ọ bula ọ gāmuputa Ya.


Ewe kewa obodo uku ahu uzọ atọ, obodo nile nke mba nile we da: ewe cheta Babilon uku ahu n'iru Chineke, inye ya iko nke manya nke ọnuma nke iwe-Ya.


O we were olu ike tie nkpu, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, ọ ghọwo kwa ebe-obibi nke ndi-mọ ọjọ, na ulo-nkpọrọ nke mọ nile ọ bula nādighi ọcha, na ulo-nkpọrọ nke nnunu nile ọ bula nke nādighi ọcha nke akpọwo-kwa-ra asì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan