Mkpughe 17:17 - Bible Nso17 N'ihi na Chineke tiyere n'obi-ha ime ìzù-Ya, na ib͕ata otù ìzù, na iwere ala-eze-ha nye anu-ọhia ahu, rue mb͕e agēmezu okwu nile nke Chineke. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a17 Chineke etinyela ya nʼobi ha imejupụta nzube ya site nʼinwe otu obi nakwa inyefe anụ ọhịa ahụ ikike ọchịchị alaeze ha, tutu ruo mgbe a ga-emezu okwu Chineke. Faic an caibideil |
M'we nu onye ahu nke yiri uwe ọcha, onye nọ n'elu miri nke osimiri ahu, o we welie aka-nri-ya na aka-ekpe-ya n'elu-igwe, were Onye ahu Nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi, si, na ọ gādiru otù mb͕e akara àkà, na mb͕e abua akara àkà, na nkera mb͕e akara àkà; ma mb͕e agāb͕ajisi aka nke ndi nsọ ahu, ihe nile ndia gāgwusi.