Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 17:1 - Bible Nso

1 Otù mọ-ozi n'etiti ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu we bia, we kpayerem uka, si, Biari, m'gēgosi gi ikpé nke oké nwanyi ahu nākwa iko onye nānọkwasi n'ọtutu miri;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji efere bịara sị m, “Bịa, aga m egosi gị ahụhụ ga-abịakwasị onye ahụ ụwa niile maara dịka akwụna, onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ọtụtụ mmiri nke ụwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 17:1
20 Iomraidhean Croise  

Ò si-kwa-ra aṅa ghọ nwanyi nākwa iko, bú obodo ahu kwesiri ntukwasi-obi? obodo ahu nke juputara n'ikpé ziri ezi! ezi omume nānọri ọnọdu-abali nime ya, ma ub͕u a ndi-ob͕u-madu.


Ma unu onwe-unu, biaruenu nso ebe a, unu umu-ndikom nke nwanyi ji igwe-oji atu isi ọma na isi ọjọ, unu nkpuru nke nwoke nākwa iko na nwanyi nākwa iko.


N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka M'b͕ajiworo yoke-gi, tijie ab͕u-gi nile; i we si, M'gaghi-efè òfùfè; n'ihi na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu nan'okpuru osisi ndu ọ bula ka gi onwe-gi nērulata onwe-gi, nākwa iko.


Gi onye bi n'elu ọtutu miri, onye nwere ọtutu àkù, ọgwugwu-gi abiawo, bú ọtùtù nke urù-gi nēzighi ezi.


Miri mere ya ka o bùe ibù, ob͕u-miri mere ya ka ọ di elu: osimiri-ya nile nāga ebe-ya akuku ihe buruburu; uzọ-miri-ya nile ka o zigara osisi nile nke ọhia.


Ha we sirita onwe-ha, Òbi-ayi ekpoghi ọku nime ayi, mb͕e Ọ nāgwa ayi okwu n'uzọ, mb͕e Ọ nēmeghere ayi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ?


Ma le, Ya na ndikom abua nēkwurita okwu, ndi bu Moses na Elaija;


Nkpughe nke Jisus Kraist, nke Chineke nyere Ya igosi ndi-orù-Ya, bú ihe nāghaghi iputa n'isi nso: O we site n'aka mọ-ozi-Ya ziga we gosi Jọn orù-Ya;


M'we hu ihe-iriba-ama ọzọ n'elu-igwe, nke di uku di kwa ebube, ndi-mọ-ozi asa ndi nwere ihe-ọtiti asa, nke bu nke-ikpe-azu, n'ihi na nime ha ka ọnuma Chineke gwuru.


Ewe kewa obodo uku ahu uzọ atọ, obodo nile nke mba nile we da: ewe cheta Babilon uku ahu n'iru Chineke, inye ya iko nke manya nke ọnuma nke iwe-Ya.


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi nelu-igwe ridata, nēnwe ike uku; ewe site n'ebube-ya nye uwa ìhè.


n'ihi na ikpé-Ya nile bu ezi-okwu buru kwa ikpé ziri ezi; n'ihi na O kpere oké nwanyi ahu nākwa iko ikpé, bú nwanyi nke were ikwa-iko-ya mebie uwa, Ọ bọ̀-kwa-ra ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya n'isi-ya.


O we sim, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi akpọworo ibia na nri-anyasi ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu. O we sim, Ndia bu okwu nke Chineke kwuru n'ezie.


Onye ahu nke nākpayerem uka nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù, bú amì nke ọla-edo, ka o we tùa obodo ahu, na ọnu-uzọ-ama-ya nile, na mb͕idi-ya.


Otù nime ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu, ndi eboro ibu ihe-otiti asa ikpe-azu, we bia; o we kpayerem uka, si, Biari, M'gēgosi gi nwanyi ahu anālu ọhu, bú nwunye Nwa-aturu ahu.


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, ọnu-uzọ ka o gheworo oghe n'elu-igwe, olu mbu m'nu-kwa-ra, olu dika nke opì nākpayerem uka, otù onye nāsi, Rigota n'ebe a, M'gēgosi kwa gi ihe nile nke nāghaghi iputa mb͕e ihe ndia gasiri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan