Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 16:6 - Bible Nso

6 n'ihi na ha wusiri ọbara ndi nsọ na ndi-amuma, ọbara ka I nyewo-kwa-ra ha ka ha ṅua: ha bu ndi kwesiri ekwesi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Nʼihi na ha wụsara ọbara ndị nsọ gị na ndị amụma gị. Ma ugbu a, i nyela ha ọbara ka ha ṅụọ. Nke a bụkwa ezi ụgwọ ọrụ ha kwesiri ịnata.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 16:6
25 Iomraidhean Croise  

ọzọ kwa, n'ihi ọbara nēmeghi ihe ọjọ nke ọ wusiri; o we mejue Jerusalem n'ọbara nēmeghi ihe ọjọ: Jehova ekweghi kwa ib͕aghara.


anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu,


Otú a ka Jehova siri, Nime nka ka i gāmara na Mu onwem bu Jehova: le, mu onwem gaje iwere nkpa-n'aka nke di n'akam tikwasi miri nke di n'osimiri Nail, ọ gāb͕anwe ghọ ọbara.


M'gēme kwa ka ndi nēme gi ihe-ike rie anu-aru onwe-ha: ha gāṅubiga kwa ọbara onwe-ha ókè, dika ọ bu manya-vine ọhu: anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi, na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.


N'efu ka M'tib͕uworo umu-unu; ọ dighi ọdidọ-aka-na-nti ha natara: mma-agha-unu erichapuwo ndi-amuma-unu, dika ọdum nke nēbibi ebibi.


Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma we gwa ndi-isi na ndi Israel nile okwu, si, Ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na o buwo amuma megide obodo a, dika unu jiworo nti-unu nu.


Ndi-isi na ndi Israel nile we si ndi-nchu-àjà, si kwa ndi-amuma, Ọ dighi ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na ọ bu n'aha Jehova, bú Chineke-ayi, ka gwaworo ayi okwu.


O sitere na nmehie nile nke ndi-amuma-ya, na ajọ omume nile nke ndi-nchu-àjà-ya, Ndi nāwusi ọbara ndi ezi omume n'etiti ya.


M'gēde kwa ọbara-gi n'ala dika miri, bú ebe i nēgwu miri, rue ugwu nile; ebe nile miri si erù gējuputa na gi.


N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu.


ma onye nāmaghi, me kwa ihe kwesiri ihe-otiti, agāpia ya utari ole-na-ole. Ọzọ, onye ọ bula enyere ihe uku, n'aka-ya ka agāchọ kwa ihe uku: onye ha nye-kwa-ra ihe uku n'aka idebe, n'aka-ya ka ha gāju ihe nke ka.


ma àhuhu ahu jọkariri njọ ra aṅa, bú nke agāgu na onye ahu kwesiri ka enye ya, ka unu chère, bú onye nke zọworo Ọkpara Chineke ukwu, onye guwo-kwa-ra ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú nke eji do ya nsọ, n'ihe emeruru emeru, onye mewo-kwa-ra Mọ nke amara ihe-ihere?


Mba nile we we iwe, iwe-Gi we bia, ya na oge ikpe ndi nwuru anwu ikpé, na inye ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, na ndi nsọ, na ndi nātu egwu aha-Gi, ndi ntà na ndi uku, ugwọ-ọlu-ha; na imebi ndi ahu nēmebi uwa.


Ọ buru na ọ diri onye ọ bula ka adọta ya n'agha, ọ bu n'agha ka agādọta ya: ọ buru na onye ọ bula gēji mma-agha b͕u madu, aghaghi iji mma-agha b͕u ya. Nebe a ka ntachi-obi na okwukwe nke ndi nsọ di.


Ewe nye ya ike inye ya ume, bú ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu, ka ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu we kwue okwu, me kwa ka eb͕ue ha, ka ha ra, bú ndi ọ bula nākpọghi isi ala nye ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu.


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


Ọ bu kwa nime ya ka ahuru ọbara nke ndi-amuma na nke ndi nsọ, na nke ndi nile eb͕uworo n'elu uwa.


n'ihi na ikpé-Ya nile bu ezi-okwu buru kwa ikpé ziri ezi; n'ihi na O kpere oké nwanyi ahu nākwa iko ikpé, bú nwanyi nke were ikwa-iko-ya mebie uwa, Ọ bọ̀-kwa-ra ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya n'isi-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan