Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 16:12 - Bible Nso

12 Mọ-ozi nke-isi we wusi ọkwa-ya n'elu osimiri uku ahu, bú Yufretis; miri-ya we tasia, ka ewe dozie uzọ ndi-eze ahu ndi si n'ọwūwa-anyanwu bia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Mmụọ ozi nke isii pụkwara wụkwasị ihe dị nʼefere ya nʼelu mmiri ukwu ahụ bụ Yufretis si otu a mee ka mmiri dị nʼime ya taa. Nke a mere ka ọ dịrị ndị eze ahụ si nʼọwụwa anyanwụ mfe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 16:12
15 Iomraidhean Croise  

Jehova gēwezuga ire oké osimiri nke Ijipt ka ebibie ya; Ọ gēji kwa okpom-ọku nke ifufe-Ya feghari aka-Ya n'elu Osimiri, tiputa ya iyi asa, me ka madu zọ ya ukwu n'akpukpọ-ukwu.


Akpọtewom otù onye site n'Ugwu, o we bia, otù onye site n'ọwuwa-anyanwu nke gākpọku aham: ọ gābiakwasi kwa ndi nọchiri anya eze dika agāsi na ha bu urọ, na dika ọkpu-ite si azọ ájá.


M'gēme ugwu na ugwu ntà ka ha kọ akọ, ihe-ọkukú-ha nile ka M'gēme kwa ka ọ kpọnwua; M'gēme kwa osimiri ka ha ghọ agwe-etiti, me kwa ka ọ̀dọ-miri nile takọ.


Onye ahu Nke nāsi ob͕u-miri, Takọ; osimiri-gi nile ka M'gēme kwa ka ha tachasia:


nēsi n'ọwuwa-anyanwu kpọ udele, nēsi kwa n'ala di anya kpọ onye gēme ndum-ọdum: e, ekwuwom, M'gēme kwa ka o me; ezubewom, M'gēme kwa ya.


ọbuná n'ihi nka, le, Onye-nwe-ayi nēme ka miri Osimiri rigokwasi ha, bú miri nke di ike di kwa ọtutu, ọbuná eze Asiria na ebube-ya nile: ọ gārigokwasi kwa ebe-ya nile miri si erù, rusa usọ-ya nile:


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M'gaje ikpe ọnu-gi, bọ̀ ọ́bọ̀-gi; M'gēme kwa ka oké osimiri-ya tasia, me kwa ka isi-iyi-ya takọrọ.


Ahuhu nke-abua agabigawo: le, Ahuhu nke-atọ nābia ọsọsọ.


O we sim, Miri nile i huru, ebe nwanyi ahu onye nākwa iko nānọdu, bu ndi di iche iche, na ìgwè madu, na mba di iche iche, na asusu di iche iche.


M'we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi n'ọwuwa-anyanwu rigo, nēnwe akàrà nke Chineke di ndu; o we were oké olu tiere ndi-mọ-ozi anọ ahu nkpu, bú ndi enyere ha ike imejọ uwa na oké osimiri,


M'we nu otù onye, ka ọ nāgwa mọ-ozi nke-isi ahu okwu, bú onye nwere opì ahu, si, Tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu ndi ekeworo ab͕u n'osimiri uku Yufretis.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan