Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 16:1 - Bible Nso

1 M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'ulo nsọ ahu dà, nāsi ndi-mọ-ozi asa ahu, Jenu, wusi ọkwa asa ahu nke ọnuma Chineke nime uwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼụlọnsọ ahụ na-ada na-agwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ okwu, “Ngwanụ, gaanụ wụsa ihe dị nʼefere ọnụma asaa Chineke ahụ nʼelu ụwa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 16:1
17 Iomraidhean Croise  

Wukwasi mba nile ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, Wukwasi kwa ala-eze nile nke nākpọkughi aha-Gi.


Wukwasi mba nile ọzọ ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, wukwasi kwa ab͕uru nile ndi nākpọkughi aha-Gi: n'ihi na ha eripiawo Jekob, e, ha eripiawo ya, me ka ọ gwusia, ha emewo kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.


O we gwa nwoke ahu nke yiri uwe ọcha okwu, si, Ba n'etiti ihe ahu nākpọre, n'okpuru cherub, kpojue icheku ọku nēre ere n'aka-gi abua site n'etiti cherubim, fesa ha n'elu obodo a. O we ba n'etiti ha n'anyam.


M'we wukwasi ha ajọ iwem dika miri; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'jiworo me ka ha gwusia: uzọ-ha ka M'tiyekwasiworo n'isi-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


N'ihi nka cherenum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), cherenu ubọchi mb͕e M'gēbili ọtọ ikwata ihe: n'ihi na ikpém bu ime ka mba nile zukọta, ka M'we chikọta ala-eze nile, iwusa ha oké iwem, bú ọnuma nile nke iwem; n'ihi na agēji ọku nke ekworom ripia uwa nka nile.


Ewe meghe ulo nsọ nke Chineke nke di n'elu-igwe; ewe hu ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu-Ya n'ulo nsọ Ya; àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, na ala-ọma-jijiji, na oké ákú-miri-ígwé we so.


Mọ-ozi ọzọ we si n'ulo nsọ ahu puta, nēwere oké olu tiere Onye ahu Nke nānọkwasi n'ígwé ọcha ahu nkpu, si, Tiye mma-iwe-ihe-ubi-Gi, we kwa ihe-ubi: n'ihi na oge hour iwe ihe-ubi abiaruwo; n'ihi na ihe agēwe n'ubi nke uwa achabigawo ókè.


Mọ-ozi ọzọ we si n'ebe-ichu-àjà ahu puta, bú onye nwere ike n'ebe ọku ahu di; o we were oké olu tiere onye ahu nke nwere mma-iwe-ihe-ubi di nkọ nkpu, si, Tiye mma-iwe-ihe-ubi-gi di nkọ, bipu uyọkọ nile nke vine nke uwa; n'ihi na nkpuru-vine-ya achazuwo.


M'we hu ihe-iriba-ama ọzọ n'elu-igwe, nke di uku di kwa ebube, ndi-mọ-ozi asa ndi nwere ihe-ọtiti asa, nke bu nke-ikpe-azu, n'ihi na nime ha ka ọnuma Chineke gwuru.


Mọ-ozi nke-asa we wusi ọkwa-ya n'elu mbara-elu-igwe; oké olu we si n'ulo nsọ ahu daputa, si n'ebe oche-eze ahu di, nāsi, Emewo ya:


Jehova we ziga gi ije ije, si, Je wezuga ndi-nmehie ahu, bú ndi Amalek, ka ebibie ha, i gēbuso kwa ha agha rue mb͕e agēme ka ha gwusia.


Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan